Gịnị na-eme n'etiti Regina Daniels na Ned Nwoko?

Ned Nwoko na Regina Daniels

Ebe foto si, Regina Daniels/Fb

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Kamgbe otu ụbọchị gara aga ka ịntanetị na-akpọtụ maka ọnọdụ alụmdi na nwunye Sịnetọ Ned Nwoko na nwunye ya bụ Regina Daniels.

Ihe onyonyo malitere ifegharị n'ịntanetị na Satọde 18 Ọktoba 2025 na-egosi ebe Regina Daniels na-eti mkpu na-ekwu na ọ dịka nwa odibo n'ụlọ Ned Nwoke mana ọ dịka ezenwaanyị n'ụlọ nke ha.

"N'ụlọ Ned Nwoko abụghị m ihe ọbụla, mana n'ụlọ m a bụ ezenwaanyị".

Ihe onyonyo ahụ gosikwara ka ndị mmadụ na-eji Regina eji ma sị ya na o zuola.

Regina gara n'ihu boo ebubo na Ned na-eti ya ihe n'ụlọ ma kwuo na ọ gaghịzi edi ya.

"Agaghị m edili ihe m na-ahụ maka na ọ karịala, ọ karịala".

Ọsịsa Ned Nwoko maka ọgbaaghara mere n'ụlọ ya

Ned Nwoko na Regina Daniels

Ebe foto si, Regina Daniels / Fb

Nkọwa foto, Ned Nwoko na Regina Daniels

Sịnetọ Ned Nwoko ji akara soshal midia ya kọwaa ihe na-eme n'etiti ya na nwunye ya bụ Regina Daniels.

O kwuru na ọ nọghị n'ụlọ mgbe ọgbaghara dapụtara n'etiti Regina Daniels na ndị ọrụ ya.

Nwoko kwuru na ya dugara otu nwa ya ụlọọgwụ mgbe nsogbu ahụ dapụtara ma kwuo usoro ya na nwunye ya bụ Regina Daniels ga-esi biri n'udo.

O kwuru na ya nwere ụmụnwaanyị anọ ndị ọzọ bụ nwunye ya na-enweghị onye n'ime ha ga-asị na ya bụ onye ọgbaaghara.

Cheta na Regina Daniels adịla na mbụ kwuo na ya na di ya bụ Ned Nwoko etofeela inwe ọgbaghara n'alụmdi na nwunye ha n'oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ.

Tupu akụkọ a apụta, BBC Igbo gbara mbọ ịnụta n'ọnụ Ned Nwoko na Regina Daniels kpọmkwem ihe na-apụ okwu mana o nweghị onye n'ime ha zara oku a kpọrọ ha.