You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị ka e merela ndị a sị bụ ndị na-achị ehi na-awakpo ọtụtụ obodo na ndịda ọwụwa anyanwụ Naijiria?
Kemgbe afọ ole ma ole garaaga, ndị a na-enyoenyo na ha bụ ndị ọchịehi wakporo ọtụtụ obodo na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa nakwa steeti agbata obi ha na mpaghara ahụ.
Steeti ndị a kpụ n'ọnụ gunyere Enugu, na Ebonyi steeti. Ebe ọzọ nke a na-eme na-abụghị ndịda anyanwụ bụ Benue steeti.
Mana ugbua, ajuju a na-aju bụ n'ime obodo ndị ahụ niile ndị a na-enyoenyo na ha bụ ndị na-achị ehi wakporo n'Enugwu nakwa Ebonyi steeti kedụ ihe gọọment megoro?
Ajuju ọzọ bụ kedụ mpụtara na nyocha ndị uweojii mere maọbụ ebe ka ndị ha jidere maka mkpamkpa ahụ nọ ugbua?
Etu ọnọdụ si dị n'Ebonyi nakwa Engwu steeti n'afọ 2025?
Enugwu steeti na Ebonyi steeti bụ steeti akụkọ pụtara na ndị na-achị ehi na-akpa mkpamkpa.
Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla, ebe ndị ọzọ nọ ọnọdụ ọ dụ ndụ ọnwụ ka mma n'ime obodo dị icheiche na steeti ahụ maka ọnọdụ ndị a na-enyoenyo na ha bụ ndị ọchị ehi tinyere ha.
Mana n'afọ a bụ 2025, lee obodo tirimkpu akwa sị na ndị na-achị ehi na-awakpo ha n'Enugwu steeti:
- Obinagu Amozalla Affa dị n'okpuru ọchịchị Udi, n'Enugwu steeti.
- Ukpata dị n'okpuruọchịchị Uzọ-Uwani n'Enugwu steeti.
- Mgbuji, Abo na Agu-Amaede nakwa Eha-Amufu dị n'okpuruọchịchị Isi-Ụzọ n'Enugwu steeti.
N'aka nke ọzọ, Ebonyi steeti bụkwa ebe ọzọ e were ndekọ banyere etu ndị ọchị ehi na-awakpo obodo.
Obodo Amegu Nkalaha dị n'Okpuru ọchịchị Ishielu n'Ebonyi steeti bụ otu ebe ndị ọchị ehi kparamkpamkpa ma gbuo ihe ruru mmadụ iri.
Gịnị ka ndị uweojii n'Ebonyi na nke Enugwu mere n'oge mkpamkpa ahụ kpara?
N'Enugwu steeti, tupuu akụkọ a apụta BBC Igbo enwetebeghị ozi n'aka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe banyere ọnọdụ nchekwa n'obodo dị icheiche n'okpuru ọchịchị Udi, Uzo Uwani nakwa Isi Uzo bụ ebe ọ na-akpọtụ na steeti ahụ maka na ọ zabeghị ajụjụ niile anyị zịgara ya.
Mana n'Ebonyi steeti, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Joshua Ukandu gwara BBC Igbo n'ekwenti na ọ bụ eziokwu na ndị a na-enyo enyo na ha na-achị ehi wakporo obodo a na-akpọ Amegu Nkalaha dị n'Okpuru ọchịchị Ishielu n'Ebonyi steeti ma gbuo mmadụ ruru iri.
Joshua Ukandu kwuru sị "e chetere m na e jidere otu onye bụ onye nyere aka ka anyị jidekwa ndị ọzọ so wakpoo Nkalaha".
Ihe e mere ndị ọchịehi ndị uweojii jidere na ndịda ọnwụwa anyanwụ?
Dịka ọnọdụ si dị ugbua, ọ bụghị ihe doro anya ihe ndị uweojii na-eme maọbụ ihe ha megoro n'Enugwu steeti banyere ndị ọchịehi maka na ha azabeghị ajuju anyị juru ha banyere ya.
Mana n'Ebonyi steeti Joshua Ukandu bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ya ga-achọpụta ihe megoro kemgbe e jidere ndị ahụ a na-enyoenyo na ha nwakporo Nkalaha ma gbuo mmadụ iri.
N'okwu ya "a ga m ajụ ndị otu anyị bụ ndị okwu ahụ dị n'aka ma chọpụta ihe megoro kemgbe ahụ ma mara ebe ndị ahụ e jidere nọ".
Ụmụnwaanyị Eha-Amufu mere ngagharịiwe maka arụ ha sị ndị ọchiehi na-akpasa ha
Ụmụnwaanyị na ndị obodo Mgbuji, Abo na Agu-Amaede karịrị narị ise nọ na-eme ngagharịiwe kemgbe ụbọchị Mọnde, 5 Maachị, 2025 maka mwakpo ndị ọchịehi na-awakpo obodo ha.
Eha-Amufu dị n'okpuruọchịchị Isi-Ụzọ n'Enugwu steeti, Naịjirịa.
A gbachiri ụlọahịa na ụlọakwụkwọ niile dị n'obodo ndị ahụ ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe.
Ụmụnwaanyi ahụ yicha uwe dị ojii iji gosi na obi adịghị ha mma. Ha na-ekwu na ndị ọchịehi na-akwaso ha iko n'ike ma jiri ụmụnwaanyị obodo ha na-eme ihe egwuri egwu ma na-emetọ ha.
Otu nwaanyị bi n'Eha-Amufu aha ya bụ Charity Eke gwara BBC na kemgbe ọnwa anọ, ndị ọchiehi egbuola maọbụ wakpoo ihe ruru mmadụ otu narị n'obodo ha.
N'okwu ya "ihe mere anyị ji eme ngagharịiwe kemgbe izuụka a bụ maka na ndị ọchịehi wakporo otu nwaanyị ma were osisi dụnye ya n'ihe o jiri bụrụ nwaanyị. Nwaanyị ahụ nọ na-agbata ọnwụ na ndụ ugbua n'ụlọọgwụ".
"Anyị chọrọ ka Gọvanọ Peter Mbah chụpụrụ anyị ndị ọchiehi n'obodo anyị n'ihi na ha egbuchaala ndị di anyị na ụmụ anyị"
Onye ọzọ na-achị obodo Mgbuji bụ Maazị Okeke Frank tiri mkpu na ha anaghịzi aga ugbo, nke ha ji akọta nri maka na ndị ọchiehi ewegharala ime ọhịa niile.
Ya bụ ngagharịiwe wuru ewu ka ha buuru gaa n'ogige ụlọọrụ Onyeisioche gọọmenti okpuruọchịchị Isi Uzo mana ndị obodo kwuru na Obiora Obagu bụ onyeisioche apụtaghị gwa ha okwu ọbụla.
Obagu kwuru na ọ bụ ndị na-agba gọọmenti ụkwụ bụ ndị chikọbara ya bụ ngagharịiwe.
Ihe a na-arụ aka kpatara nsogbu a
Nchọpọta gosiri na kemgbe afọ anọ gara aga ka nsogbu ndị ọchịehi na ndi ọrụ ugbo malitere n'Eha-Amufu dị n'okpuruọchịchị Isi-Ụzọ n'Enugwu steeti.
N'ime afọ 2023 na 2024 ndị ọchi ehi gburu ihe karịrị mmadụ iri anọ (40) na mwakpo ha mere ndị obodo Mgbuji.
Ihe na-ese okwu wee bụrụ na ndị ọchịehi na-eji ehi ha atacha ihe ndị ọrụ ugbo kọrọ n'ugbo ha. Ha sị na o nwee ka onye nwe ugbo siri kwuo okwu, ha ewere mma bepụ ya isi.
Ihe ọjọọ a na-eme kemgbe afọ anọ gara aga nke mere na ụmụnwoke anaghịzi aba ime ọhịa.
Ụmụnwaanyị ndị sịkwanụ ka ha gaa ugbo weta akpụ maọbụ ji ka agụụ hapụ igbu ụmụ ha, ka ndị ọchịehi na-ejide rịa ha elu n'ike ma tinye osisi n'ihe ha ji bụrụ nwaanyị.
Dịka ụmụnwaanyi Mgbuji, Abo na Agu-Amede siri kwuo, ọtụtụ n'ime ha ka e gburu ka a wakpochara ha.
"Gọọọmenti anaghị ege anyị ntị kemgbe afọ anọ anyị tiwere mkpu".
"Anyi anaghịzi akọ ugbo, agụụ na-egbuzi ụmụaka anyị maka na anyị enweghị gọọmenti chọrọ ige anyị ntị".
Eha Amufu nakwa Isi-Uzo niile bụ ndị e ji ịkọpụta nri dịka osikapa, ji, ede, akpụ, wee mara, mana kemgbe afọ anọ, ha anaghịzi aba n'ugbo ha dịka ndị obodo ahụ siri depụta n'ọkọlọtọ ha ji eme ngagharịiwe.
Gịnị ka Gọọmenti kwuru?
Onyeisioche okpuruọchịchị Isi-Ụzọ bụ Maazị Obiora Obeagu kwuru n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Tọzde 6 Maachị, 2025 na ọ bụ ndị achọghị ka gọọmenti ya gaa n'ihu na-ebute ọgbaaghara na ngagharịiwe.
O kwuru na ọ bụ aghọtaghị atụmatụ gọọmenti kpatara ndị mmadụ ji eme ngagharịiwe.
"Abalị gara aga mụ na ụmụnwaanyị na-eme ngagharịiwe ahụ nwere nzụkọ, ebubo a na-asọ oyi, ọ bụghị ihe mere eme kama ọ bụ ihe ndị kpọkọrọ ha sị ha kwuo."
"N'oge gara-aga, anyị na ndị ọnụ na-eru n'okwu nwere mkparịtaụka ebe anyị gwara ha na gọmenti ga-arụ ebe ehi ga anọ bụ "Ranch, "Farm Estate na Pruce City". Ọ bụ ya kpatara ha jiri eme ngagharịiwe si na gọọmenti chọrọ iweghara ala nna nna ha nyefee n'aka ndị ọchịehi. Ụfọdụ ihe ha na-ekwu mere afọ ole na ole gara aga".
Onyeisioche Obeagu gara n'ihu kwuo "anyị kwetara na ọgụ na nsogbu na-adapụtakarị n'etiti ndị ọchịehi n'Eha Amufu banye Ebonyi na Benue gbara ha gburu gburu, mana ya bụ nsogbu emebeghị kemgbe afọ iri na ise gara aga."
Ọ gara n'ihu kwuo na Gọọmenti Peter Mbah na-arụsi ọrụ ike iweta nsogbu ndị ọchịehi na ndị obodo na njedebe.
Ọ dọrọ aka na ntị na ndị nchekwa ga-akpara ndi ndọrọndọrọ ọchichi na onye Ụkọchukwu a na-enyo enyo aka ha dị n'ichikọba ngagharịiwe n'Eha Amufu.