Fact-check: Akụkọ ahụ ị na-achọ ike, ọ bụ akụkọ ụgha ka ọ bụ nke ezie?

Dịka oge ntuliaka 2023 ji ọsọ abịa, ọtụtụ ihe na-esokarị ntuliaka nke gụnyere mbịpụta na nkesa akụkọ ụgha maọbụ akụkọ ga-ebughe ọha n’ụzọ agụghọ.
Marakwa na ịma ụma maọbụ amaghị ama kesa akụkọ ụgha nwereike inyere ndị ọjọọ aka kesa emumnobi ọjọọ ha.
Ihe mbụ ị kwesịrị ịma bụ na ịbụ ụzọ kesa akụkọ ọhụrụ gbawara n’ọha na-enwe ọghọm so ya.
Gba mbọ nyochaa ma tulee akụkọ niile tupu ikesa ya. Kedụ ka ịga esi mara ma akụkọ ịhụrụ n’ịntanetị, soshal media maọbụ n’ọba ozi ọbụla ọ bụ eziokwu ka ọ bụ ugha?
Nke mbụ: Ọ bụrụ na ịnụ maọbụ hụ akụkọ banyere onye ọbụla ọkachasị onye ndọrọndọrọ ọchịchị maọbụkwa banyere ụlọọrụ nakwa otu ọbụla, gba mbọ gaa n’akara soshal media maọbụ n’ọba ozi ha n’ịntanetị ka ịchọpụta ma enwere ihe onye ahụ maọbụ ndị ahụ kwuru banyere ya bụ akụkọ.
Nke abụọ: Gbaa mbọ chọpụta ma ụlọọrụ ntaakụkọ dịka BBC bụ nke ọha na-agbara ezi ama ma na-akwanyere ugwu n’ọrụ e zipụtara ozi a, ọ bụrụ na enweghị ọtụtụ ndị akesara ya bụ akụkọ, biko lebara ya anya .
Marakwa na e nwere ọtụtụ ụlọọrụ ntaakụkọ nke ndị na-ekesakarị akụkọ ụgha, rụba ụlọọrụ ntaakụkọ ndị a ama ma ihee asaa n’anya tupu ikweta maọbụ kesaa akụkọ si n’ọba ozi ha.
Nke atọ: Ọ bụrụ na ịhụ foto maọbụ ihe onyonye banyere akụkọ maọbụ banyere mmadụ otu ọbụla, gbaa mbọ nnyocha ma ya bụ foto maọbụ ihe onyonye agbabụọla n’ịntanetị n’oge aga ma chọpụta ma enwere ndị chọrọ iji ihe onyonyo ahụ maọbụ foto ahụ gbaa akụkọ ụgha Kedụ ka ị ga-esi mara ma foto agbabuola n’ịntanetị na mbụ?
• Buru foto ahụ gaa na websaịtị ebe a na-achọ ihe n’ịntanetị dịka Google nakwa ebe ndị ọzọ.
• Google nwereike inye gị ohere inyocha foto ma ịpịa aka na ‘Right click’, ị ga-ahụ "search Google for image" maọbụ "Search with Google lens".
• Google ga-egosi gị ebe ndị ọ zọ nakwa mgbe ndị ọzọ ekerela foto ahụ ma ọ bụrụ na ọ gbabuola n’ịntanetị mbụ
• Nyochakwa akụkụ ebe onye maọbụ ndị nọ na foto ahụ nọ, lee anya ma hụ ma ebe a sị na ya bụ akụkọ mere ma ọ bụ eziokwu, leele akara ụgbọala nọ nso, maọbụ akara ụlọ, ahịhịa nakwa ihe irebeama ịma ma ya bụ ebe ọ bụ nke ezie
Nke anọ: Ọ bụrụ ị nata ozi n’akara Whatsapp gị nke gosiri na ọtụtụ ndị ekekọrịtala ya bụ akụkọ, ị ga-ahụ n’asụsụ Bekee ka e dere “Forwarded many times”, mara na onye zitere gị akụkọ ahụ nwereike ọ maghị ebe isi mmiri akụkọ ahụ malitere.
Akụkọ ndị na-adị etu bụ akụkọ mmadụ kwesiri ilebara anya tupu ọ kesaa ya agbanyeghị ma onye kesara ya a sị na o si n’aka ụlọọrụ ntaakụkọ a na-akwenyere ugwu maọbụ sị na onye a ma ama binyere ya aka.
Nke ise: Ọ bụrụ na ọ kwe gị omume, gbaa mbọ zịgara onye, otu maọbụ ụlọọrụ ọbụla ezipụtara ozi maka ha na soshal midia ịjụ ma ihe ị hụrụ maọbụ nke ezie a.
Ịchọpụta na akụkọ ọbụla bụ akụkọ ụgha tipu mkpu maka ya ma kpesara ụlọọrụ mgbasaozi nke soshal midia ebe ekere ya bụ akụkọ na ya bụ ihe bụ akụkọ ụgha, etu a ị ga-agbapụta ndị ọzọ n’aka ajọ akụkọ.
Ndị na-ebipụta akụkọ ụgha nwere uru ọjọọ ha na-erite n’ime ya, ekwela ka ha rabanye gị



