E bulala ozu Shinzo Abe bụbụ Praim Minista Japan na Tokyo

Ozu Shinzo Abe

Ebe foto si, Getty Images

Ugbọala bu oziu Shinzo Abe

Ebe foto si, Peter Obi

Nkọwa foto, E bulatara ozu Shinzo Abe na Tokyo ..

E sila na Nara ebe a gbagburu ya bulaa ozu Shinzo Abe bụbụ Praim Minista Japan na Tokyo taa bụ Satode.

Otu onye bu egbe a kpọrọ Tetsuya Yamagami gbara Abe egbe ebe ọ na-agwa ọha okwu n'ọgbakọ achụmntavootu e mere na Nara n'ụbọchị Tozde.

Abe , onye a gbara egbe ugboro abụo nwụụ n'ụlọọgwụ ka ọ kachara awa anọ ndị dọkịta gbaralịrị ịzọ ya ndụ.

A gbagbuola Shinzo Abe bụbụ Praim Minista Japan

Shinzo

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii mba Japan na-ekwu na onye gbagburu Shinzo Abe, Praim Minista ha ochie bụ Tetsuya Yamagami.

Ya bụ nwaadị gbara afọ 41 chere na Abe so na otu mejọrọ ya n'oge gara aga.

Ọzọ, Onyeisiala Muhammadu Buhari etiela ndị mba Japan aka n'obi gbasara ọnwụ Abe.

Shinzo Abe, bụbụ Praim Minista Japan, anwụọla dịka ọ gbarachara ya egbe, dịka ụlọakụkọ mba ahụ siri kwuo.

Abe, onye gbara afọ 67 nwụrụ n'ụtụtụ taa bụ Fraide n'ụlọọgwụ dịka a gbara ya egbe n'azụ ugboro abụọ ebe ọ na-agwa ọha okwu n’ọgbakọ ịchụ nta vootu maka otu onye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Ọ bụ onye Praim Minista mba Japan kachasị nọọ n'ọkwa.

Aka kpara onye a na-enyo gbara ya egbe ahụ e kwuru dị afọ 41 ozigbo ọ gbara ya egbe ahụ ụbọchị Tọzde.

Shinzo Abe, Muhammadu Buhari

Ebe foto si, NGRPresidency/Twitter

Nkọwa foto, Shinzo Abe nabatara onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari mgbe ọ bịara njem nleta na Japan n'afọ 2019.

Praim Minista Japan bụ Fumio Kishida gwara ndị ntaakụkọ na mwakpo e mere Abe bụ "agwa imeọhịa nke agaghị anabata."

Ngalaba gbatagbata mba ahụ kwunuru na apa mgbọ egbe dị n'aka ekpe olu Abe kwukwo na ọbara si akụkọ akaekpe obi ya.

Abe ka dị ndụ oge a gbachara ya egbe mana ọnọdụ ya kawanyere njọ n'ụlọọgwụ ebe e tinyere ya ọbara, dịka ụlọakụkọ siri kwuo.

Ihe ndị nọ ebe ihe mere hụrụ

Onye a na-enyo gbagburu Shinzo Abe

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Onye a na-enyo gbagburu Shinzo Abe dịka aka ndị ọrụ nchekwa kpara ya

Ndị nọ ebe ihe mere hụrụ ot nwoke bu nnukwu egbe.

site na-azụ gbaa Abe egbe ugboro abụọ.

Abe na-ekwu okwu iji kwado onye na-adọ ndọrọndọrọ ọchịchị na ebe a kpọrọ Nara dị nso ebe ụzọ jikọrọ ọnụ oge ya bụ ihe mere.

E kwuru na onye mere ihe ahụ bi na Nara aha ya bụ Tetsuya Yamagami.

Ụlọntaakụkọ mba ahụ kwuru na a na-eche na Yamagami bụbụ onye ọrụ agha mmiri mba Japan.

Ozi Abe bụ nke o na-emere pati ọ bọbu na ya bụ 'Liberal Democratic Party' dịka mba ahụ na-akwado ntuliaka maka ụlọomeiwu nta mba ahụ nke a ga-eme n'izuụka na-abịa.

Ngwangwa nke a mere, e ziri ozi ka ndị mịnịsta nile si ebe ọbụla ha nọ laghachie na Tokyo, isiobodo Japan.

Na soshal midia mba Japan, ọtụtụ ji akara 'hashtag' 'Anyị chọrọ ọchịchị onyekwuoucheya ọbụghị tigbuo-zogbuo mwakpo a wakporo Abe.

Onye bụdị Shinzo Abe a?

Shinzo Abe

Ebe foto si, Getty Images

  • Abe bụ onye kachasị nọ n'ọkwa Praim Minista Japan dịka ọ nọọ n'ọkwa ottu afọ nn'afọ 2006 ma laghachikwa azụ n'afọ 2012 rue afọ 2020.
  • Ọ rịtururu n'ọkwa n'afọ 2022, n'ihi ọnọdụ ahụike ya dịka ọ gbara ama na ọ na-arịa ọrịa onye afọ a kpọrọ 'ulcerative colitis' na Bekee.
  • Onye nọchiri ya bụ Yoshihide Suga bụ onye Fumio Kishida bụ Praim Minista ugbua nochiri.