'Adị m afọ 33, osote m dị afọ 26 na-azọ isioche Amac n'Abuja' - Ugoh

- Onye dere ya, Marvelous Obomanu
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Toochi Ugoh onye ji pati APP azọ ọkwa onyeisioche 'Abuja Municipal Council' (Amac) nke FCT na ntụlikaka a ga-eme na abalị iri abụọ na ọtụ nke ọnwa Febụwarị afọ 2026 ekwuola na ọ bụ ọdịka mmadụ chọrọ ka ụmụnwaanyị nwere ikike ọchịchị ya mere o ji kpọrọ otu nwaada dịka osote ya na ntụliaka ahụ.
O kwuru na Amac na mba Saụt Afrika kwesịrị ị na ama aka mana etu ọ dị ugbua, Amac emegaghị ọfụma.
"Ihe mere eji anụ maka mmepe AMAC bụ n'ihi minista na-ahụ maka FCT bụ Nyesom Wike"
Mgbe BBC Igbo jụrụ ya maka ebumnobi ya maka nchekwa, o kwuru na ndị na-enye nsogbu na Amac bụ ndị ntorobịa mana ya bụrụ na-ewepụta ọrụ, nsogbu nchekwa ga-ebelata.
"Anyị na-aga achụnta vootu gburugburu n'ime obodo. Anyị na-ahụ nsogbu dị iche iche, anyị ma ihe anyị ga-eme eweta ngwọta zuru oke"
Ọ kọwara na ego eji arụ ọrụ na Amac Karịrị akarị iji rụọ ọrụ mana ndị nọ n'ọchịchị anaghị ekwe ka eji ego ahụ mmepe obodo.






