You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị omekome agbagbuola ọkaikpe n'ime ụlọikpe
Ndị omekome egbuola otu ọkaikpe aha ya bụ Nnaemeka Ugboma bụ onyeisi ụlọikpe nta dị n'Ejemekwuru n'okpuruọchịchị Oguta dị n'Imo steeti.
Akụkọ kwuru na egburu ya mgbe ọ nọ n'oche na-ekpe ikpe n'ime ebe ahụ nke mere ka ndị mmadụ gbakọrọ n'ebe ahụ gbapụ ọsọ ndụ.
Ndị hụ ihe mere gwara onye ntaakụkọ BBC na ndị ahụ mere nke a bu ọgbatumtum bịa n'ụlọikpe ahụ.
"Ha baara n'ime ụlọikpe dọpụta ya n'ilo, gbagbuo ya ma si ebe ahụ pụọ" ka ọ kọọrọ anyị.
O kwukwara na ndị mmadụ ji egwu gbahapụ ozu nwoke ahụ dịka ha na-agba ọsọ ndụ iji zọ onwe ha.
Onyeisioche otu jikọrọ ndị ọkaiwu na steeti ahụ bụ Ugochukwu Allinor kwuru na ọ bụ n'ezie na egburu ọkaikpe ahụ.
O kwukwara na agba otu ha nke dị n'Owere na-etikota isi ọnụ ịma ihe ha ga-eme maka ọdachi a ma zikwaa ọha mmadụ ozi mgbe oge ruru.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Henry Okoye azaghị ekwentị ya maọbụ zaa ozi e zigaara ya maka ihe a mere.