63% pasentị ndị Naịjirịa bi n'ime ụbịam - Gọọmentị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ngalaba gọọmentị na-ahụ maka ngụkọ bụ 'National Bureau of Statistics' na-ekwu na pasentị iri isii na atọ ndị niile bi na Naịjirịa dara ụbịam.
Nke a bụ ihe dị n'ime akwụkwọ nnyocha a kpọrọ '2022 Multidimesional Poverty Index' (MPI), nke ngalaba NBS wepụtara n'ụbọchị taa bụ Tọzde, Nọvemba 17 2022.
Nnyocha sitere n'ijikọ aka nke ngalaba NBS, 'National Social Safety-Nets Coordinating Office (NASSCO), United Nations Development Programme (UNDP), United Nations Children Fund (UNICEF) na Ozford Poverty and Human Development Initiative (OPHI).
Ezinụlọ puku iri ise na isii bi na steeti niile dị na Naịjirịa nakwa Abuja ka a jụrụ ajụjụ ọnụ malite n'ọnwa Nọvemba 2021 ruo ọnwa Febrụwarị 2022 iji nweta mpụtara nnyocha a.
Mmadụ nde 133 bi n'ụbịam

Ebe foto si, NBS
Dịka mpụtara nnyocha nke ngala NBS mere si gosi:
- Ọnụọgụgụ ndị bi n'ime ụbịam na Naịjirịa ruru nde 133
- Ndị ụbịam bi na mpaghara Ugwu Naịjirịa dị nde 86, nke bụ pasentị 65 ndị ụbịam niile na Naịjirịa
- Na mpaghara Ndịda Naịjirịa, ọnụọgụgụ ndị ụbiam ruru nde 47, maọbụ pasentị 35.
- Steeti ebe ọnụọgụgụ ndị kacha bụ na Sokoto, ebe e nwere pasentị 91 ndị bi n'ime ụbịam
- Ondo steeti bụ ebe ọnụọgụgụ ndị ụbịam kacha nta; pasentị 27
- Ihe karịrị ọkara ndị bi na Naịjirịa dara ụbịam n'ụzọ niile, ọtụtụ n'ime ha na-eji nsị anụmanụ, nkụ, nakwa unyi esi nri.
- Na steeti niile na Naịjirịa, ndị dara ụbịam n'ego dị ọnụala karịa ndị dara ụbịam n'ụzọ ndị ọzọ
- Ọnụọgụgụ ndị dara ụbịam karịrị n'ime obodo dị icheiche (72%) karịa ndị n'ebe mepere emepe (42%)
- Ihe karịrị ọkara ndị ụbịam niile na Naịjirịa bụ ụmụ ntakịrị.
- Ụmụaka ụbịam karịrị n'ime obodo, ọnụọgụgụ ha karịrị pasentị 90
- Otu a ka ọnụọgụgụ ụbịam ụmụaka si dị na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa: North-East na North-West karịrị pasentị 90; South East nwere 74%; South-West nwere 65.1%






