Charles abụrụla Eze ọhụru

Mgbe Ezenwaanyị nwụrụ, ọkwa ya fere n'enweghi mmemme ọbụla n'aka Charles, onye bụbu Ọkparaeze Wales.

Mana e nwere ụfọdụ ihe ọ ga-eme tupu ekpunye ya okpueze n'isi dịka Eze.

Kedụ aha a ga-akpọ ya?

Otu ihe mbụ ọ ga-eme bụ ịkpebi ma a ga-akpọ ya 'King Charles III' ma ọ ga-ahọro aha ọzọ.

Iji ma atụ, nnanna ya George VI na-azabu Albert mana ọ ji aha ndị ọzọ ya chị. Charles nwereike ịhọrọ n'aha ndị ọzọ ya - Charles Phillip Arthur George.

Ọ bụghị naanị ya ka aha ya ga-agbanwe.

N'agbanyeghị na ọ bụ ya bụ osote n'ọkwa ọchịchị, Ọkparaeze William agaghị aghọrọ 'Ọkparaeze Wales'. Mana ọ ga-aghọrọ 'Duke Cornwall' ozigbo ozigbo. Nwunye ya bụ Catherine ga-abụrụzị 'Duchess Cornwall'.

A ga-enwe kwa aha ọhụrụ maka nwunye Charles onye ga-abụrụzị 'Queen Consort' na Bekee -"consort" bụ ihe a na-akpọ di maọbụ nwunye Eze maọbụ Ezenwaanyị.

Mme mme ndị a na-eme

N'elekere iri abụọ na anọ dịka nne ya nwụchara, a ga-akpọpụta Charles dịka 'Eze'. Nke a ga-eme n'Obieze St James dị na London n'ihu otu pụrụiche akpọrọ Accession Council.

Otu pụrụiche a ga-agụnye ndị otu Privy Council - ndị Minista ukwu ma nọ n'ọkwa na ndị rituru n'ọkwa, ndị nwere ọkwa ukwu na Gọọmentị, ndị nnọchiteanya mba Commonwealth dị icheiche nakwa Lord Mayor nke London.

Ihe ruru mmadụ narị asaa nwereike ịbịa na ya bụ mmemme mana etu ọ bụ ihe ngwangwa, ndị ga-abịa agaghị eruzi etu ahụ. Na 'Accession Council' ikpeazụ emere n'afọ 1952, ihe ruru mmadụ narị abụọ bịara ya.

Dịka ọdịnala si dị, Eze agaghị eso n'ọgbakọ ahụ.

Na nzụkọ ahụ, a ga-ekwuputa ozi ọnwụ Ezenwaanyị nke ga-esi n'ọnụ Lord President nke Privy Council (bụ Penny Mordaunt MP), a ga-agụpụtakwa akwụkwọ ozi maka ya.

Etu e si dee ya bụ ozi ahụ nwereike ịgbanwe, mana n'usoro ya, ọ na-abụkwarị ekpere nakwa nkwa, ndị na-ekele Ezenwaanyị ma na-egosi Eze ọhụrụ nkwado.

Ụfọdụ ndị ukwu ga-ebinyezi akwụkwọ ozi ahụ aka ndị gụnyere Praịm Minista, Archbishop nke Canterbury nakwa onye akpọrọ Lord Chancellor.

Dịka e si eme na ụdịrị ọgbakọ pụrụiche a, a ga-elebanye anya n'ihe nwereike ịgbanwe, ihe a ga-ewepụ nakwa ihe enwereike itinye iji gosi ọchịchị ọhụrụ.

Ozi mbụ nke Eze ga-ezi

Accession Council ga-ezute ọzọ - ihe dị ka otu abalị ga-aga mana ugbua, Eze ga-eso ya na ndị Privy Council.

E nweghi "idu n'iyi ọrụ" na mbido ọchịchị Eze ndị mba Briten dịka e si enwe onyeisiala mba ndị ọzọ dịka nke mba Amerịka. Mana e nwere nkwụpụta Eze ọhụrụ ga-eme, dịka usoro ahụ si dị kemgbe oge gboo - ọ ga-ekwe nkwa idebe Ụlọụka nke Scotland.

Dịka opi ike fụchara, a ga-enwe mgbasaozi n'ọha mmadụ ga-akpọpụta Charles dịka Eze ọhụrụ. A ga-eme nke a n'elu ebe akpọrọ Friary Court dị na Obieze James nke onye ọrụ pụrụiche akpọrọ Garter King of Arms ga-eme.

Ọ ga-ekwu: "God Save the King", nke ga-eme na kemgbe 1952, mgbe mbụ a ga-akpọ abụ mba Briten, a ga-abụ "God Save the King".

A ga-agbapụ egbe nkwanye ugwu na Hyde Park, ụlọ ogologo nke London, n'ụgbọmmiri nke ndị agha mmiri, dịka a ga-akpọpụta Charles Eze n'Edinburgh, Cardiff nakwa Belfast.

Ichi echichi ya

Ihe a ka echeta maka echichi ga-abụ mgbe a ga-echi Charles echichi.

Mana maka nkwado e kwesịrị imere ya, echichi ya agaghị eme ọsịisọ - Ezenwaanyị Elizabeth bara ọchịchị na Febụwarị 1952, mana e chiri ya echichi na Juun 1953.

Kamgbe afọ 900 gara aga a na-echi echichi na Westminster Abbey - William dike n'agha bụ onye eze mbụ e chiri echichi ebe ahụ, Charles ga-abụ onye nke iri anọ.

Ọ ga-abụ ụka ụdị ndị Anglịkan, ebe onye ga-aka ụka ga-abụ Archị Bishop nke Kantabri. Ka emmume ga-agbalielu, ha ga-ebukwasa okpueze St Edward n'isi Charles - nke bụ sọ ọlaedo e mere kamgbe afọ 1661.

Ihe a bụ ọla dị n'etiti okpu ndị Eze nke dị n'ụlọ ogogo elu nke Lọndọn, ọ bụ naanị n'ụbọchị echịchị ka a na-ekpu nke a (tinyekwara na ọ na-anyị arụ rụọ 2.23kg).

Emume a nke na-adịghị ka emume agbamakwụkwọ ezinaụlọ ndị

Eze bụ nke gọọmentị na-akwụ ụgwọ maka ya.

Ọ bụkwa naanị gọọmentị na-akpoku ndị ọbịa ga-abịa sonye na ya.

Aga agụ egwu, gụọ ihe ederedere ma mee omenala iti onye ọchịchị ọhụrụ mmanụ nke eji ngwọkọ mmanụ oroma, okoko roosu, cinamọnụ, mọọskụ na ambargrịs.

Aga edu Eze ọhụrụ ahụ iyi ọrụ n'ihu ụwa niile.

N'emume a pụrụiche, aga enye ya ọla ikike ịrụ ọrụ dịka Achịbịshọpụ nke Canterbury ga-ekpunye ya okpuEze ọlaede n'isi.

Onyeisi otu Commonwealth

Charles abụrụla onyeisi Commonwealth, nke jịkọrọ mba 56 nweterela nnwereonwe nakwa ijeri mmadụ abụọ na ụma.

Mba 14 n'ime mba ndị a nke gụnyere mba UK, Eze bụ onyeisiala ha.

Mba ndị a nke e ji aha 'Commonwealth realms' mara gụnyere: Australia, Antigua and Barbuda, the Bahamas, Belize, Canada, Grenada, Jamaica, Papua New Guinea, St Christopher and Nevis, St Lucia, St Vincent and the Grenadines, New Zealand, Solomon Islands, Tuvalu.

©All photographs are copyright