Deborah Samuel Yakubu : Lee ọnọdụ ezinaụlọ nwaada e gburu na Sokoto kemgbe Pastọ Chibuzọ Chinyere nyechere ha ụlọ
BBC Igbo gara Pọtakọt ga hụ ọnọdụ nne na nna Deborah Samuel Yakubu bụ onye e gburu ma gbaa ọkụ maka ihe ndị gburu ya hutara ka mkparị ọ kparịrị onyeisi ụka Alakụba bụ Mohammed.
Onyeisi ndị ụka Omega Power Ministry bụ Chibuzo Chinyere kpọdatara ha Pọtakọt nye ha onyinye ụlọ na ụgbọala.
Onyinye ndị a tụrụ nne na nna nwaada ahụ n'anya nke ukwu nke bụ na ọ bụ naanị ekele na otito ka ha ekele Chineke nakwa Pastọ Chibuzọ.
Pastọ sị na ihe mere ya jiri kpọdata ha Ala Igbo bụ maka na ya hụrụ na ha nweghị ezi nchekwa n'Ugwu Awụsa, maka na ụmụntorobịa na-akpa aghara maka ịtọhapụ ndị gburu ya bụ nwaada ndị uweojii ji eji.
O kwukwara na ihe ọzọ meturu ya n'obi bụ na nna ya bụ nwaaada e gburu egbu sị na ụmụ ya agaghịzị aga ụlọakwụkwọ ọzọ.
Ọ sị na ọ bụ ya mere ya jiri sie ọnwụ ịkpọdata ha.
Ugbua, nwanne Deborah nke nwoke bụ Mathew Emmanuel sị, "ihe mere nwanne m nwaanyị mere ka m chee na-agaghịzị m aga akwụkwọ ọzọ, mana ugbua, Pastọ emeela ka m chegharịa dịka ọ kwetara ịkwụwara m ụgwọ akwụkwọ".
Deborah bụ nwata akwụkwọ n' ụlọakwụkwọ Shehu Shagari College of Education bu onye e gburu ma gbaa ọkụ n'abalị 12 nke ọnwa Mee, afọ 2022 maka ebubo na ọ kparịrị Mohammed.