Toyin Lawani: Ihe o were m ịkwapụta akwa Ifu Ennada yiri gaa AMVCA n'ezie

Aha onyonyo, Ka m si kwapụta ejije na-ewu ewu n'AMVCA 2022

Aka ọrụ nwaada Toyin Lawani bụ ọkwanka na-akwa akwa pụtara ihe n'emume AMVCA nke 2022 n'ebe ọ dị ukwuu.

Ya bụ nwaada ji aka kwaa ọtụtụ ihe nke ndị mmadụ huru tie mkpu.

Ndị a ma ama na-agba ya aka ahịa nke ukwuu.

Ọtụtụ ndị ejije Nollywood nakwa ndị mba ofesi na-akpọ ya oku kwa mgbe kwa mgbe maka aka ọrụ ya.

Iyi akwa pụrụiche bụ ihe ndị a ma ama ji emere onwe ha aka dịka ụwa na-agba ha nkiri, nke a kwaara nwaada Lawani ụzọ n'aka ọrụ ya.

Ọ nweghị ihe o jighị adụ akwa, nke gụnyere efere, iko mmiri, nduru nri, akwụkwọ akụkọ na ọtụtụ ihe uche mmadụ agbataghị.

Ihe anyị chọpụtara bụ na ọtụtụ ndị bịara ya bụ mmeme wetere akwa ha jiri bịa ebe ahụ n'aka nwaada Lawani, agbanyeghị na ọ bụghị akwa ya tuuru ugo ọkaibe n'ejiji emume ahụ.

Nwaada Lawani kwuru "E ji ma akwa m akọ akụkọ ndụ".

Ọ sị na ya kwawara akwa kemgbe afọ iri abụọ gara aga.

"A na m eme ihe ndị ahịa m chọrọ".

Ọ sị na uwe ahụ akwanyere isi mmadụ na ya nke o yi gaa ya bụ emume mere ka ọtụtụ kwuo okwu ọma na nke ọjọọ.

"Ndị ọ masịghị sị na ọ bụ maka na ọ dị okeọnụ ($100,000) mana ndị dị etu ahụ amaghị na ya bụ uwe nwereike ịda ọnụ karịa etu ahụ ma e weputa ya n'ahịa n'ọdị n'ihu.

Kirie ọtụtụ ihe o kwuru ebe ahụ.

Aha onyonyo, Mkparịtaụka BBC Igbo na Chioma Akpotha

Akụko ga-amasị gị