You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Yul-Edochie azaghachila ndị mmadụ maka nwaanyị abụọ ọ lụrụ
Onye ejije a ma ama bụ Yul Edochie apụtala kwuo okwu gbasara nwunye abụọ nke ọ lụrụ.
N'ihe onyonyo o tinyere n'akara Facebook ya, ọ kwuru sị "ọ bụ ndụ m, ọ sọ m alụọ m nwaanyị iri abụọ na ise maọbụ iri ise".
Ọ sị na o teela aka ndị mmadụ na-eji ya si ya gbachi nkịtị mana o gaghị agbachi nkịtị gbasara okwu a.
Ike niile ndị mmadụ na-emefu n'ihe gbasara ya na ezinaụlọ ya bụ ihe mere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ejighi ha kpọrọ ihe.
"O nwere otu sị na ha ga-awụlite Naira n'ebe Dọlla dị mana ha emeghị nke a. unu ejirila ike a niile gwa ha okwu?" ka o kwuru n'ịchafụ n'onyonyo ahụ.
Kedụ ihe iwu Naijiria kwuru maka ịlụ ọtụtụ nwaanyị?
Dịka ọ na-akpọtụ na soshal midia na onye ihe ejije Nollywood bụ Yul Edochie alụọla nwaanyị nke abụọ, ajụjụ ọtụtụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ kedụ ebe Iwu Naijiria kwụ na okwu nwoke ịlụ nwaanyị ụbara.
Ọkachamara n'okwu iwu Naijiria bụ Ọkaiwu Chima Nnaji kọwara BBC Igbo ebe iwu Naijiria kwụ n'okwu a gbadoro ụkwụ alumdinanwunye Yul na nwaanyị mbụ ya nwere.
Cheta na n'abalị 27 nke ọnwa Eprelụ afọ 2022, Yul Edochie bụ onye kwupụtara na nsonso a na ya chọrọ ịzọ ọkwa onyeisisla, wepụtara foto agadaga nwanwoke were kwupụta na ya alụọla nne nwata ahụ dịka nwaanyị ya nke abụọ.
Ọkaiwu Nnaji kọwara na ọ bụrụ na Yul lụrụ nwaanyị mbụ ya nanị n'iwu omenala, na nsogbu ọbụla adịghị ya.
Mana ọ bụrụ na ka ha mechara nke omenala, ha lụrụ n'iwu Bekee, ịlụ nwaanyị nke abụọ ga-etinyeli na mkpọrọ n'ihi na ọ dara iwu Naijiria.
"N' alụmdi na nwunye na otu nwoke na otu nwaanyi na enweghị onye ọzọ. Onye lụrụ nwaanyị n'ụlọikpe agaghị alụ nwaanyị ọzọ."
"Ọ gaa n'ụlọikpe kweta na ọ lụrụ nwaanyị nke abụo, ị mara na Igwe agaala nga."
Ebe omenala Igbo kwu n'okwu a
N'aka, nke ọzọ, otu onye omenala Igbo were anya bụ Edy Nwangene Odenigbo kwuru na omenala Igbo nabatara nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị n'ihi na ọ na-enyere ha aka n'ọrụugbo.
Odenigbo,onye kwuru na-agbanyeghị na ya bụ onye omenala, na ya agaghị alụ karịa otu nwaanyị sịrị,"Omenala Igbo kwadoro nwoke ịlụ ụbara nwaanyị n'ihi na ọ na-enye ohere ịmụta ọtụtụ ụmụ."
"Mgbe ochie, anyị na-arụ ọrụụgbo. Ndị nwere ọtụtụ nwaanyị na ọtụtụ ụmụ na-akpọ ha aga ọrụugbo."
Ebe ụka Katolik kwụ n'okwu alụm ọtụtụ nwaanyị
Fada Cajetan Iyiobi kọwara n'iwu ụka Katolik megidere Nwaanyị ịlụ karịa otu nwaanyị.
"Ụka Katoliki anabaghị nwoke maọbụ nwaanyị ịlụ onye nke abụọ ma lụkwa onye ọzọ.
"Ọ bụrụ na o mee ya, a ga-ekewapụ ya, ọ kwụsị ịnata oriri dị asọ."
Iyiobi bụ ụkọchukwu na Nsuka Dayọsịs kọwara na 'adịghị agba alụkwaghịm n'ụka Katọlik kama e nwere ike kagburu alumdinanwunye mbụ ya bụ oge nwoke maọbụ nwaanyị inwe ohere ịlụ n onye ọzọ.
Mana dịka Fada Iyiobi siri kọwaa ụka Katolik e nwere ike ime ka ịsị na ọgbamakwụkwọ mmadụ nwere adịghị ire ma ọ bụrụ na o nwere onye ghọgburu ibe ya na agbamokwukwo nke e mere eme.
Iji maa atụ: 1. Ọ bụrụ na o nwere ọrịa nwoke maọbụ nwaanyị bu mana ọ gwaghị di ya maọbụ nwunye ya.
2. Ọ bụrụ na nwoke maọbụ nwaanyị sị na ya alụbeghị nwaanyị maọbụ di mbụ e mechaa a chọpụta na ọ lụọla
Yul-Edochie wife: Ihe Tchidi Chikere, Uche Maduagwu,Ugezu,na ndị ọzọ kwuru maka Yul Edochie ịlụ Judy Austin
Kemgbe ụbọchị 27 Eprel, 2022 akụkọ na onye ejije Nollywood Yul Edochie lụrụ nwaanyị nke abụọ a kpọrọ Judy Austin Muoghalu gbakapụtara, ịntaneti enwurula ọkụ.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-akatọ Yul sị na o metaghị ya, na-agbanyeghị na ọ pụtara ọzọ kwuo na "ma e tere ogiri, e tere ụgba" na nwunye ya nke mbụ bụ May Yul Edochie bụ isi nwaanyị.
Mana ụfọdụ a ma ama dịka Tchidi Chikere na Ugezu Ugezu na-akwado ya.
Tchidi Chikere na-ahazi ejije na Nollywood onye turu Yul "Odogwu!" katọrọ ndị na-ekwu ihe ọjọọ maka ihe Yul mere sị na ha bụ ndị ihu abụọ.
"Ọtụtụ ụmụnwoke na ụmụnwaanyị na-akatọ gị bụ ndị ihu abụọ. Ndị ihu abụọ juru ụwa."
Ugezu Ugezu kwuru na ọ na-agba ya gharịị ụmụnwaanyị ndị na-eso nwoke lụrụ nwaanyị ebe ọtụtụ ụmụnwaanyị na soshal midia na-akatọ nwoke ịlụ ọtụtụ nwaanyị.
Mana ndị dịka Uche Maduagwu, Chizzy Alichi na Nkechi Blessing kwuru na Yul dawara ukwu.
Maduagwu kwuru na Yul kwesịrị ịrịọ nwunye mbụ bụ onye o kwuru nọnyere ya oge ọ na-ata ahụhụ mgbaghara.
Ọ sịrị, "Ọ bụrụ na i nwere ike ime nwaanyị nọnyere gị ụdị ihe, kedụzi ihe ị ga-eme Naijjiria ma ọ bụrụ na a tụnyere gị dịka onyeisioche okpuru ọchịchị?"
N' otu aka ahụ, Chizzy Alichi na Nkechi Blessing bụkwa ndị ejije Nollywood kwuru na "ịlụ otu nwaanyị kacha mma."
Ihe ị kwesịrị ịma maka May Yul-Edochie ọ lụrụ tupu ọ lụọ Judy Austin
Yul Edochie na-eme ejije Nollywood depụtara n'akara soshal midia ya.
Ọ depụtara ka ụwa bia hụrụ akataka nwa nwoke nwunye ya nke abụọ aha ya bụ Judy Austin mụrụ ya.
O kwuru na aha nwa ahụ bụ STAR DIKE MUNACHIMSO YUL - EDOCHIE.
N'ọnụ ya, "oge eruola mgbe ụwa kwesiri ịmata nwa m nwoke, onye mụrụ ya bụ nwunye m nke abụọ bụ Judy Austin, @judyaustin1. Ahụrụ m nwa m nwoke n'anya etu m si hụ ụmụ m ndị ọzọ n'anya."
N'okpuru ihe ahụ Yul Edochie depụtara ka ahụrụ ebe nwunye ya bụ May Yul-Edochie dere na "chukwu ga-ekpe Yul na Judy ikpe."
Nke a mere ka ọtụtụ mmadụ bido kwuwe maka ihe a Yul Edochie depụtara.
Onye bụ Yul Edochie?
Yul Edochie bụ onye na-eme ejije Nollywood.
Ọ bụ nwa Peter Edochie na-emekwa ejije Nollywood.
Ọ bụ onye Nteje dỊ n'Anambra steeti.
Yul na nwunye ya bụ May Edochie ji ụmụ anọ gụnyere otu nwaanyị na ụmụnwoke atọ.
O kwuru na ọ lụrụ May mgbe ọ dị naanị afọ 22, n'ụbọchị 31 nke ọnwa Ọktoba afọ 2004.
A mụrụ ya n'ụbọchị asaa nke ọnwa Jenụwarị afọ 1982.
N'afọ 2017 ka Yul Edochie zọrọ ọkwa gọvanọ nke Anambra steeti n'okpuru pati Democratic Peoples Congress (DPC).
Ihe ị kwesịrị ịma maka May Edochie
May Edochie (aha nna ya bụ Aligwe) bụ nwunye Yul nke ọ lụrụ oge ọ ka bụ nwokorobịa na-etolite etolite (o kwuru na ha lụrụ mgbe ọ dị afọ iri abụọ na abụọ).
May mụtara ụmụ anọ; otu nwa nwaanyị na nwa nwoke atọ.
A mụrụ ya n'ụbọchị 16 nke ọnwa Septemba.
Ọ gụrụ "Computer Engineering" na mahadum Enugu State University of Science and Technology (Esut).
Ọtụtụ ndị ma ya na-ekwu na ọ bụ nwaanyị obi ọma, na ọ naghị enye maọbụ chọọ nsogbu.
Onye bụ Judy Austin?
Ezigbo aha ya bụ Muoghalu Uchechukwu Judith.
Ọ bụ onye ejije Nollywood, nke ya na Yul Edochie mekọrọla ejije mbụ.
Ọ bụkwa onye mmepụta ejije nke Bekee kpọrọ producer; o mepụtala ejije a kpọrọ "Native Girl" nakwa "Fear".
Ọ malitere ime ejije n'afọ 2013.
Ọ bụ onye Anambara steeti.
A mụrụ ya n'ụbọchị 31 nke ọnwa Disemba.
Ọ gara mahadum na Nnamdi Azikwe University, Awka.
Na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Vanguard nwere n'afọ 2020, Judy kwuru sị na ọ naghị "ahụ alụmdinanwunye dịka ihe mmadụ ji etozu oke".