Africa Eye: Etu okporoụzọ mba Kenya si ata isi ọtụtụ ndị mmadụ agharaaghara
BBC Africa Eye enyochapụtala mpụ dị iche iche ndị ọrụ okporoụzọ na mba Kenya na-eme.
Nke a gụnyere ịna aka azụ iji nye ndị mmadụ akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala nakwa inye ụgbọala ndị na-etozughi oke ikike ịgba n’okporoụzọ.
Site n’afọ 2020 ruo afọ 2021 ọnwụ ndị mmadụ na mba Kenya site n'ihe mberede okporoụzọ riri elu ruo pasentị 20.
N’afọ 2021 ihe karịrị mmadụ 4,500 nwụrụ n’ihe mberede okporoụzọ ebe ihe karịrị mmadụ 16,000 merụrụ ahụ na ya bụ ọnọdụ.
Gọọmentị mba Kenya kwuru na ndị ọkwọ ụgbọala ịṅụ mmanya ma na-anya ụgbọala, ibu oke ibu n’ụgbọala nakwa ụgbọala ịgba oke ọsọ so n’isi ihe ndị kacha ebute mberede okporoụzọ na mba ahụ.
Ihe ọzo na-amụnye ọkụ n’ọnọdụ a bụ nrụrụ aka a si ndị na-enye akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala na Kenya na-eme.
Otu onye ntaakụkọ bụ Richard Chacha, dara ngwọrọ site n'ime mberede okporoụzọ mgbe ọ dị naanị afọ iri sonyere Africa Eye mee nchọpụta ahụ.
Ha gbara n'anwụ etu ndị ụlọọrụ na-enye ndị chọrọ imụta etu e si anya ụgbọala ọzụzụ.
Ọzọ bụkwa etu ha si enye akwụkwọ ikike inya ụgbọala n'ụzọ na-ezighi ezi site n'ịna aka azụ.
Nyocha a gosiri na ọ bụ ihe ndị a so mee ka mberede okporoụzọ rịa ibe ya elu na mba ahụ.
Kirie ihe ndị ha chọpụtara n'akwụkwọ a.