Buhari agaghịzị nleta ahụ ọ chọburu ịga na mba ofesi ka ọ pụtara Kenya

Buhari

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala Muhammadu Buhari agaghịzị nnyocha ahụ ọ kwadoro ịgabụ na mba ofesi ka ọ gachara mba Kenya maka ọgbakọ ndị United Nations Environmental Programme.

O kwughị ihe mere o jighị gaa mba Britain maka nnyocha ahụ ọkwadoburu ime.

Na ya bụ njem o mere n'ọgbakọ nke 50 otu ahụ Buhari gụnyere nsogbu mbara ihuigwe, ọhịa na ihe niile dị ya n'ime, mmụbanwanye ọmụmụ na igwe mmadụ na ahịhịa ha na-emepụta so n'ihe na-enye ụwa mmekpeahụ ugbua.

UNEP

Ebe foto si, UNEP@50

Onyeisiala na Ibrahim Thiaw bụ Odeakwụkwọ ndị UN Convention to Combat Desertification (UNCCD) ndị na Naịrobi zukọkwara.

Buhari nọ na ya bụ ọgbako kpọọ oku ka Ministri na ahụ maka ugburugburu, nke na-ahụ maka mmiri, nke ọrụugbo an ọdịmma ime obodo nakwa nke ọkụ jikọọ aka chụọ alaọkpọnkụ ọsọ ukwu eruala.

Onyeisiala awuchielarị n'Abuja kemgbe ehihie ụnyaahụ bụ Fraịde.

Onyeisi ndị uweojii na Naịjirịa agbakwunyela ejiji ndị ọzọ n'uwe ụmụnwaanyị ndị uweojii

Onye uweojii nwaanyị

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ndị uweojii Naịjriịa bụ Usman Alkali Baba agbakwunyela ejiji ndị ọzọ n'uwe ụmụnwaanyị ndị uweoji.

Ya bụ iwu ọhụrụ ehibere nyere ohere ụmụnwaanyị ndị uweojii Naịjirịa ịna eyizi obere iyerintị nakwa ịchafụ n'ime okpu ha.

N'akwụkwọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Officer Olumuyiwa Adejobi tinyere aka, ọ sị na ọ bụ otu a ka e si eme ya na mbaụwa.

Ọ sị na nke a dị mkpa iji gosi nabata ụmụnwaanyi nakwa igosi mmasi na omenala ndị.

O kwuru na ọ dị mkpa igosi nabata na mmasi ebe umu nwaanyị nọ nakwa igosi nnabata ebe ofufe na njirimara ndị nọ".