Archbishop Ugorji abụrụla onyeisi 'Catholic Bishops Conference of Nigeria'

A họpụtala Archibishop Lucius Ugorji dịka onyeisi otu jikọrọ ndị Bishọpụ Ụka Katọlik na Naijiria nke Bekee kpọrọ 'Catholic Bishops Conference of Nigeria' (CBCN).

Cheta na nnukwu Ụkọchukwu Ugorji bụ Archibishopụ nke Owere Dayọsis a họpụtara ọhụrụ.

Ọ ga-eweghara ọkwa ahụ n'aka Most Rev. Augustine Obiora Akubeze bụ onye jibu ọkwa ahụ kemgbe afọ anọ.Onye ka na-enyere ya aka dịka osote ya bụ Archbishop Matthew Ndagoso nke Dayọsis nke Kaduna ebe odeakwụkwọ otu ahụ bụ Bishop Donatus Ogun, OSA, nke Dayọsis Ụromi.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Bishop Lucius Ugorji ga-anọchi anya Archbishop A.J.V Obinna

Pope Francis akpọpụtala aha Bishọp Lucius Ugorji dịka onye ga-anọchi anya Archbishop Anthony J.V Obinna n'ọkwa Archbishọp nke Owerri Dayọsis.

Nke a na-abịa dịka Archbishọp Obinna ji aka ya wụsa ọwa dịka ọ gbarala afọ 75 bụ afọ ndị ụkọchukwu ụka Katọlik ji ala ezumike nka.

Ndị Papal Nuncio kwuputere maka nhọpụta ọhụrụ a na nzukọ ndị Catholic Bishops' Conference of Nigeria (CBCN) nke mbụ n'afọ 2022 a na-eme n'Abuja.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Archbishop Anthony .J. V. Obinna

  • Ọ bụ Bishọp nke Owerri, Imo steeti ruo mgbe ọ wụsara ọwa.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 26 nke ọnwa Juun, afọ 1946
  • E chiri ya ụkọchukwu n'ụbọchị itoolu nke ọnwa Epreelụ afọ 1972.
  • E chiri ya echichi nke Bekee kpọrọ Episcopal n'ụbọchị anọ nke ọnwa Septemba 1993.
  • E bugoro ya n'ọkwa Archbishọp n'ụbọchị 26 nke ọnwa Maachị afọ 1994
  • Ọ bụ Archbishọp mbụ nke Archdayọsis nke Owerri, ma si n'ụlọụka Maria Assumpta Cathedral, Owerri achịkwa dayọsis ya.

Ihe ị kwesịrị ịma maka Bishop Lucius Iwejuru Ugorji

  • Ọ bụ Bishọp nke Umuahia, Abịa steeti.
  • Ọ bụ osote onyeisi otu jikọtara ndị Bishọp ụka Katọlik nke Naịjiria (Catholic Bishops' Conference of Nigeria).
  • Ọ bụkwa ihe a kpọrọ "Apostolic Administrator" onye nchịkọta Apọstọlik nke ndị Ahiara, Mbaise, Imo steeti, n'ụbọchị 19 nke ọnwa Febrụwarị, afọ 2018.
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 13 nke ọnwa Jenụwarị afọ 1952.
  • E chiri ya ụkọchukwu n'ụbọchị 16 nke ọnwa Epreelụ afọ 1977
  • E chiri ya echichi nke Bekee kpọrọ Episcopal n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Julaị afọ 1990.