Nnamdi Kanu Case: Ozi m na-ezi bụ ihe Kanu gwara m zie

Aha onyonyo, Aka ji Nnamdi Kanu ji ndị Igbo niile

BBC Igbo na Ifeanyi Ejiofor bụ ọkaiwu Nnamdi Kanu nwere mkparịtaụka dịka ekpechara ikpe Kanu n'ụbọchị 16 nke ọnwa Febụwarị afọ 2022.

Ọkaiwu Ejiofor bụ otu n'ime ndị ọkaiwu na-anọchite anya Kanu, onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob), n'ikpe Gọọmentị Naijirịa na-ekpe ya n'ebubo gụnyere ịkpalite ọgbaaghara na Naijirịa, sara ajụjụ gbasara etu ya bụ ikpe si aga kemgbe a nwụchichara Kanu.

Ejiofor rụtụrụ aka n'okpu a kpụ n'ọnụ dịka ekpechara ya bụ ikpe nke gụnyere ịmezu ihe ọkaiwu kwuru maka uwe Kanu, enyo anya ya, ihe Simon Ekpa kwuru gbasara ozi Nnamdi Kanu na-ezi Ejiofor dgz.

Gbasara ihe ọ ga-eme iji hụ na emezuru ihe ọkaikpe kwuru?

Ọkaikpe Ifeanyị Ejiofor zara sị, "anyị ga esosi ya ike iji hụ na emere ihe ọkaikpe sị ka e mee, agaghị m enye ha ohere".

Maka okwu ndị nchekwa ekweghị ịgbanwe uwe Nnamdi Kanu?

Ejiofor kọwara na achọghị ka Kanu yiri akwa isiagu.

O kwu sị, "Ọ nweghị m hụrụ ọ mere ya iyi akwa siagu bịa ụlọ ikpe, kama ọ bụrụ ya ka a ga-eme ka ihe dị mma, anyị ga-eme ya".

Maka ndị na-ekwu na ha agaghị ege ya ntị n'ihi na ọbụghị ihe Kanu kwuru ka na-ekwu

Ọ zara sị, "Anụbeghị m na e nwere ndị si na ha anaghị ege m ntị".

Ọ bụ Nnamdi Kanu ziem ozi m zie ha.

Ka ọ dị ugbua, e yigharịala ya bụ ikpe gaa ụbọchị asatọ nke ọnwa Epreelụ afọ 2022.

Lee ihe onyonyo a n'uju ka ị mata ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ o kwuru

Onye bụ Nnamdi Kanu?

Nnamdi "Nwannekaenyi" Okwu-Kanu hibere ma bụrụ onyendu otu a ma dịka Indigenous People of Biafra (Ipob) n'afọ 2012.

Otu ahụ chọrọ ka steeti ndị dị na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ kewapụ na Naịjiria ma bụrụ mba a kpọrọ Biafra.

Nke a abụghị ihe ọhụrụ dịka ndị ọchịchị Igbo n'afọ 1967 kpebiri na a ga-enwe Biafra, mana ka a lụchara agha nke butere ọnwụ mmadụ ruru otu nde, atụmaatụ ahụ abiaghị na mmezu.

Kanu malitere Redio Biafra nke e hibere na London n'afọ 2009 ma na-agbasa ozi nye ndị Igbo bi na Naịjirịa.

N'afọ 2018 ka gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob ndị oyi ndụ egwu.

Ọ gara Government College Umuahia, gaa mahadum na Naịjiria, (University of Nsukka) nwa mgbe nta tupu ọ gawa London, ebe ọ nọ gaa London Metropolitan University.

Ọ gụrụ 'Politics and Economics' na mahadum.

A mụrụ ya na Naịjiria mana o nwekwara akwụkwọ ikike (passport) ịbụ onye mba Briten.

Ọ lụọla nwaanyị ma jide ụmụ.

O kwenyere na ma bụrụ onye ofufe Judaism.