Ndị ọrụ ụgbọelụ n'Amerịka ekwuola na 5G network nwereike itinyere ụgbọelụ aja na garị n'ufe

Dịka ụlọọrụ ekwentị mba Amerịka abụọ bụ Verizon na AT&T na-akwado ikpuhe ikuke 5G ekwentị echi bụ Wenezde, ndị ụlọọrụ ugboelu kacha ibu iri adọọla aka na ntị na ya bụ ikuku ekwentị nwereike inye ụgbọelu na-efefe nsogbu n'elu.

Ha sịkwa na ya bụ ọgbatauhie ya bụ ikuku 5G nwereike ibutere ha njọahịa ma mekwaa ka akụnaụba ha kpụọ afọ n'ala.

Ha na-atụ egwu na C-band 5G nwereike imetuta akụrụngwa ụgbọelụ ji ahụ ụzọ Bekee kpọrọ 'navigation system' ọkachasi mgbe urukpuru ojii ka njọ.

Ndị ọrụ ugboelu a degaara ndị ọrụ ụgbọelụ mba Amerika akwụkwọ ịdọaka na ntị a.

Ndị isi na Delta Air na United Airlines so na ndị na-eti mkpo ka gọọmentị "were ọsọ were ije lebeanya na nsogbu a iji gbalahụ ọdachị nwereike ikwusi ndị njem ụgbọ mmiri, ngwaahịa ọkachasị mbụgharị ọgwụ mgbochi n'ụwa".

BBC hụrụ ya bụ akwụkwọ e degaara odekwakwụ ndị ọrụ njem bụ Pete Buttigieg, ụlọọrụ Aviation Administration (FAA), onyeisi ndị Federal Communications Commission nakwa ndị National Economic Council.

BBC ghọtakwara na ndị ọnụ na-eru n'okwu na gọọmentị mba Amerịka na-etinye ọnụ na ya bụ okwu n'ụzọ pụrụiche.

Ndị ọrụ ụgbụelụ a chọrọ ka gọọm̀entị gbambọ wezụga igwe mgbasa ozi 5G ihe dịka maịlị abụọ n'akụkọ ọdọuụgbụelụ ebe ya bụ ihe na-enye nsogbu dịka ụlọrọ FAA kwuru na 2022.

"Nke a ga-enyeaka inye ohere maka ka 5G ghara imetuta ụgbọelụ na-efeli efeli iji gbochie ọgbata uhie so ya".

A gbkwunyere na "Anyị jikwa ohere a arị ndị FAA ka ha chọpụta igwe nzikọrịta ozi dị n'akụkọ okproro be ụgbọelu si efepụ wepụ ha tupu ha emebie ihe".

Ụlọọrụ na-arụpụta ụgbụelu abụọ bụ Airbus and Boreing ekwubuola ihe mbụ.