You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Delta State News: Ụmụaka atọ anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ 18 merụrụ ahụ n'ụlọ dara na Delta Steeti
Charles Aniagwu bụ Kọmịshọna mgbasa ozi nke Delta State ekwuola na mmadụ anọ nke gụnyere ụmụaka atọ nwụrụ n'ụlọ nke ụlọ ụka Salvation Ministry nọ n'ime dara n'ụzọ Okpanam nke dị na Delta Steeti.
Ụlọ a dara n'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Jenuwarị afọ 2022 n'ihe dịka elekere ise nke mgbede.
Aniagwu kwuru na mmadụ atọ nwụrụ ụnyiahụ ebe otu onye nwụrụ taa n'ụlọọgwụ.
BBC Igbo jụrụ ya maka kepukepu na-ekwu na-amanyere iwu ịkụda ụlọ a afo ole na ole gara aga
O kwuru sị, "ọbụghị maka etu e siri rụọ ya bụ ụlọ mere ka akagbuo ya, ọ bụ nghọtaghe n'etiti ndị nwe ala na ndị rụrụ ụlọ ebe ahụ butere nkagbu a".
Aniagwu kọwara na ọ ga-esiri gọọmentị ike ịnyocha ụlọ niile arụrụ were mara ma ha esiri ike.
O kwukwara na ha ehiwela atụmatụ ịnyicha ihere ka ya bụ ụlọ daa, ma sị na n'oge na adịghị anya na gọọmentị ga-ekwupụta mpụtara nyocha ha.
Ihe onye ntaakụkọ BBC Igbo chọpụtara n'ebe ahụ
Onye ntaakụkọ anyị na-ekwu na ihe ruru mmadụ iri na asatọ merụrụ ahụ ebe a ka na-achọ ndị ọzọ achọ.
Ọ na-ekwu kwa na a na-aka ụka eji eme emume obubu ọnụ abalị iri abụọ na otu mgbe ụlọ a dara.
Ọ bụ kwa n'ebe ụmụaka na-aka ụka bu ụzọ daa.
BBC Igbo ghọtara na ndị ọrụ gbata gbata abịaghị n'oge, kama ha abịala n'ụtụtụ a ịzọpụta ndị ka tọrọ n'ime ụlọ ahụ.