Nnamdi Kanu: Etu anyị si gaa hụ ya n'ụlọmkpọrọ DSS - Ike Ekweremadu

Onye bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu Naịjirịa bụ Sịnetọ Ike Ekweremadu gaara njem nleta n'ụlọmkpọrọ ndị DSS ebe ọ gara hụ onye ndu Ipob bụ Nnamdi Kanu.

Ọnụ na-ekwuru ya bụ Uche Anichukwu gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu kama na ọ bụ na ngwụcha afọ 2021 ka Ekweremadu gara ebe ahụ.

Ekweremadu mgbe ọ na-aza ajụjụ n'ụlọ ntaakụkọ Dream FM dị n'Enugwu, ọ sị na ha emeghi ka njem ahụ pụta ihe n'ihi ọ bụ ọrụ ha na-arụrụ ndị Igbo.

Ọ sị kama na ụlọọrụ DSS mere ka ọ pụta ihe n'ozi ha wepụtara.

Ọ sị na ya na ndị gụnyere; Enyinnaya Abaribe, Okey Emuchay, Bishọp Sunday Onuoha so gaa njem ahụ.

Ekweremadu gara n'ihu kwuo na ha nwere mkparịtaụka mịtara mkpụrụ maka iji okwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị egbo nsogbu ịtọhapụ Nnamdi Kanu.

Ọ sị na ha na mere mkpesa banyere ụfọdụ ihe ma na-echekwa nzaghachị n'aka gọọmentị etiti.

N'okwu banyere Onyeisiala Buhari ịsị na ọ gaghị atọhapụ Nnamdi Kanu, Ekweremadu sị na ọ tụghị anya ka Onyeisiala kwuo na ọ ga-atọhapụ Kanu.

"Maka na ọchịchị abụghị naanị nke ụlọọrụ Onyeisiala kama na o metụtara ndị ụlọikpe nakwa ndị omeiwu.

"O nweghi mgbe Onyeisiala kwuru na e nweghi ike iji ụzọ mkparịtaụka udo (polictical solution) tọhapụ Kanu."

Cheta na ọtụtụ ndị Igbo nwere agba gụnyere Mbazulike Amaechi, Chukwuemeka Ezeife gara rịọ Onyeisiala Buhari ka ọ tọhapụ Nnamdi Kanu.

Mana mgbe onyeisiala na-azụ ajụjụ na Channels TV n'ịzuụka gara aga sị na ọ gaghị eme ya kama ka Kanụ zara ọnụ ya n'ụlọikpe.