Paralympics 2021: Ịkpụ ụzụ na-eme ka m chefuo na m nwere nkwarụ - Lucy Ejike Obichukwu

Aha onyonyo, Paralympics 2021: Ịkpụ ụzụ na-eme ka m chefuo na m nwere nkwarụ - Lucy Ejike Obichukwu

Nwada Lucy Ejike Obichukwu bụ onye nwere ngwarụ mana o gbochighi ya ime egwuregwu masịrị ya, nke bụ ịkpụ ụzụ a na-akpo 'powerlifting' na Bekee.

Ọ kọọrọ BBC Igbo etu o si were egwuregwu a gaa asọmpi Olympics nke ndị nwere nkwarụ ma mabute ọtụtụ ọlaedo n'Afrịka nakwa Mbaụwa.

Obichukwu sị na mmasị ya n'ịkpụ ụzụ malitere mgbe ọ dị obere ka nna ya kpọgaara ya n'ebe a na-elekọta ndị nwere nkwarụ ka ya n'Enugwu Steetị.

Ọ sị na o si ebe ahụ malite ịkpụ ụzụ ma sonye zie n'egwuregwu banyere ya bụ 'paralympics' n'afọ 2003.

Obichukwu sị na ịkpụ ụzụ a na-eme ka o chefuo na o nwere nkwarụ ọbụla na ọ bụ ya na-akpalite mmụọ ya.

Ọ lụrụ Ikechukwu Obichukwu bụ onye nkwarụ ibe ya bụ, ha amụtala ụmụnwoke abụọ mana nke ahụ egbochighi ha ịga n'ihu n'asọmpi ịkpụ ụzụ.

Kirie ihe o kwuru n'uju;