Dave Umahi: Gịnị na-ese mere Gọvanọ Ebonyi jiri tụkwasa N500,000 n'isi Kenneth Nwakparanta?

Gọvanọ Dave Umahị nke Ebonyi steeti atụkwasịla pụkụ narị Naịra ise (N500,000.00) n'isi otu nwaamadi bụ onye ọ sị chọrọ ịgba pati ya bụ APC mgba okpuru.

A na-ebo Kenneth Nwakparata bụkwa onye pati APC na ọ chọrọ ihibe ọgbakọ echi bụ Satọde bụ ụbọchị APC chọrọ ịhibe ọgbakọ ukwu ha a kpọrọ "congress" na asụsụ Bekee na steeti ahụ.

Nwakparata na ndị otu ya chọrọ ihibe ọgbakọ nke ya na ụlọnkwarị a kpọrọ 'Salt lake Hotels' nke Senetọ Obinna Ogba bụ Onye omeiwu nke PDP nwe.

Nke a mere Gọvanọ Umehị ji nye iwu na nzụkọ e ji agwado ya bụ 'congress' taa bụ Fraịde ka e mechie ụlọoriri bụ ebe Nwakaparanta na ndị ona-eso ya hibere ya bụ ụlọnkwarị bụ Mazị Ogba maka nke a.

Ọ bụ na ya bụ ụlọnkwarị ka ndị PDP na enwekarị ọgbakọ nke ha.

Umahi kwere nkwa ịnye onye ọbụla kpụtara Nwakparata na ndị otu ya puku narị Naịra ise (N500,000.00) iji naa onye ahụ aka ma jaa ya mma na ndụ.

Ọtụtụ ndị nwere agba bịara ya bụ ọgbakọ nke gụnyere ndị gọvanọ chiburu steeti ahụ, ndị omeiwu ochie na nke ọhụrụ, ndị eze ọdịnala nakwa ndị ọzọ nwere agba na pati APC.

Akụkọ ga-amasị gị