Ifeanyi Ubah: 'Ihe mere m jiri soro ndị Alaba agụrụ Nnamdi Kanu egwu'

Aha onyonyo, Ifeanyi Ubah: Ihe mere m jiri achụ nta vootu na Legọs

Dịka akụkọ na-efeghari na ndị ahịa chụpụrụ Ifeanyi Ubah na Legọs, o kwuola nke ọ si bụ eziokwu banyere njem ya n'ahịa Alaba.

Ọ sị na ọ gara Alaba ịhụ ndị isi ahịa ahụ.

Ọ sị na o meghi achụmnta vootu ebe ahụ dịka ya siri mee n'ahịa Ladipo na ahịa ndị ọzọ ọ gara na Legọs, makana oge adịghị.

Dika o siri kwuo, ihe mere o ji bịa Legọs maka achụmnta vootu bụ iji ohere ahụ gwa ndị Anambara nọ Legọs ka ha gwa ndị nọ n'ụlọ ka ha tụnyere ya vootu ma ntuliaka ruo.

Maazị Ubah sị na ọ bụghị ụjọ maka mkpamkpa na-akpa n'Ọwụwa Anyanwụ mere o ji gawa Legọs.

Gee ya ntị n'uju.