You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Onye bụ Angela Nwosu a ndị mmadụ kpụ n'ọnụ?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Angela Nwosu bụ nwaanyị a ma ama na soshal midia maka etu o si ekwu okwu nakwa ahịa ọ na-ere.
Ọ bụ onye na-akwado ihe omenala, na-akpọ onwe ya Ogbanje, na-akụziri ndị mmadụ maka alụmdinanwunye ha ma bụrụkwa onye meburu ihe onyonyo.
Ugbua ọ na-ewu ewu maka ebubo mmadụ boro ya gbasara nne ya a sị na ọ gbahapụrụ n'obodo ha.
Nwosu sara ihe niile gbasara ọnụ ndị mmadụ na-akọ ya na mkparịtaụka nke ya na BBC nwere n'ụbọchị Wenzde.
Mana onye bụ nwaanyị a ndị mmadụ kpụ n'ọnụ?
Mgbe BBC Igbo na Angela Nwosu nwere mkparịtaụka pụrụiche, ọ kọwara ọtụtụ ihe maka onwe ya.
Lee ihe ndị BBC Igbo chọpụtara maka ya:
- Ọ bụ onye Nnewi-ichi n'okpuruọchịchị Nnewi North na Anambra steeti ma o toro na Legọọs.
- A mụrụ ha ụmụ isii n'afọ nne ya nke mere na ọ bụ osote Ada n'ezinaụlọ ya.
- Ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Madonna nke dịkwa n'Okija Anambra steeti.
- Nna ya nwụrụ n'afọ 2016.
- Ọ lụrụ di ya bụ Austin Nnaemeka a ma dịka 'Soundmind' n'afọ 2019.
- Di ya bụ onye ji ego achụ ego ma bụrụkwa onye na-emepụta ihe onyonyo.
- O zutere di ya n'elu soshal midịa nke bụ Facebook tupu ha amalite iyi onwe ha.
- Ọ mụrụ nwa mbụ ya n'ọnwa Juun afọ 2021.