You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Rachel Oniga: Ihe i kwesịrị ịma maka nwaanyị ọma a larala mmụọ
Nwaanyị a ma ama na-eme ihe nkiri bụ Rachal Oniga anwụọla dịka ọ gbachara afọ iri isii na anọ.
Onyeisi otu ndị na-eme ihe nkiri na Naịjirịa bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) bụ Emeka Rollas sị na nwa nwaanyị ahụ gwara odeakwụkwọ ya na ọ bụ eziokwu.
"Nwa ya gwara odeakwụkwọ na nne ya nwụrụ n'ihe dịka elekere iri nke abalị 30 Julaị, 2021.
Emeka sị na ha amatabeghi ihe butere ọwwụ nwaanyị ahụ.
Ihe i kwesịrị ịma maka Rachel Oniga
- Rachel Oniga bụ a nwafọ obodo Eku dị na Delta Steetị
- A mụrụ ya na Legọs n'ọnwa Mee afọ 1957 n'Ebutte Metta dị na Legọs Steetị.
- Ọ gụrụ akwụkwọ n'ụlọakwụkwọ Princess Girls dị n'Abula Oja nke Yaba, Legọs.
- Ọ mụrụ ụmụ atọ mana ya na di ya gbara alụkwaghịm tupu ọ nwụọ.
- Ọ rụrụ ọrụ dịka 'Computer Programmer'.
- Ọ malitere ime ihe onyonyo n'afọ 1993.
- Ụfọdụ ihe nkiri ndị o mere gụnyere; Sango (1997), Owo Blow (1997), Passion of Mind (2004), Royal Hibiscus (2017), Wedding Party (2018), My Village People (2021) dgz.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọnwụ Rachel
Onyeisi otu na-eme ihe nyonyo na Theatre bụ Jide Kosoko sị ya "laa n'udo"
Hilda Dokubo tinyekwara ọnụ sị na ọ na-akpọkaarị ya "Nne m nne m". Ọ sị na eluigwe nwere anya ukwu mgbe ụfọdụ maka ọnwụ Rachel.