Sunday Igboho ga-esi n'ụlọ mkpọrọ ndị uweojii banye nga

Sunday Igboho na-azọ nwereonwe "Yoruba Nation" ka ga-anọ n'ụlọ mkpọrọ rue mgbe ụlọikpe ga-ekpe ikpe ya ma a ga-akpọlata ya Naịjirịa.

Nke a bụ ihe pụtaranụ ụnyahụ dịka ụwa na-atụ anya na a ga-ekpe ikpe ya n'ụlọikpe dị na Cotonou.

Cheta na otu ụnyahụ ahụ ka ụlọikpe nyere iwu ka nwụnye Ropo Igboho ga na-eleta ya na nga dịka ọ na-eche ka ekpe ya ikpe.

Awụchịrị ya na nwunye ya na July 19, 2021 mgbe ha si Cotonou aga mba Germany mana ha mechara hapụ nwunye ya bụ Ropo.

Otu Eze na mba Cotonou kwuru na Igboho nwerike ị ga nga ruo afọ 21 maọbụrụ na o jighị ezigbo akwụkwọ njem nke Benin mana ọkaiwu ya kwuru na o jidighị akwụkwọ njem ndị Benin cha cha.

Ihe ndị mmadụ na-ajụ bụ e nwere ike ikpe onye na-emejọghị iwu otu mba maka iwu ọ dara na mba ọzọ? Nke a bụ ajụjụ ụlọikpe ga-aza n'oge na-adịghị anya.

Nwunye Sunday Igbogho gaa na-aga eleta ya n'ụlọ nga

Otu kpọrọ onwe ha Ilana Omo Oodua ewepụtala ozi ọhụrụ banyere ikpe Sunday Igbogho na-achọ nwereonwe ndị Yoruba.

Ọnụ na-ekwuru otu a bụ Maxwell Adeleye sị na obi dị ha ụtọ na ndị ọrụ nchekwa Benin Republic atọpụla ịga ha tinyere Igbogho n'ụkwụ nakwa aka.

Ha sị na e nyere nwunye Igbogho ohere ịga na-eleta ya n'ụlọmkpọrọ ugboro atọ kwa ụbọchị.

Adeleye sị na onye dọkịta si n'aka ndị ọkaiwu ha nyochara Sunday Igbogho ahụ.

Taa ka ụlọikpe dị na Cotonou ga-ekpe ikpe Sunday Igboho na-azọ nnwereonwe ndị Yoruba site na mba Naịjiria.

Nke a bụ mgbe mbụ nwa amadi a na-agba n'ihu ụlọikpe ọbụla kamgbe ọ malitere zọwa nwereonwe otu akpọrọ "Oduduwa Republic."

A nwụchịrị Igboho na nwunye ya bụ Ropo na ọdọụgbọelu dị na Cotonou mana emechara hapụ nwunye ya ma jide Igboho dịka a ga-amata ma aga akpọlata ya Naịjirịa taa n'ụlọikpe.

Kamgbe ahụ anwụchichara Igboho na Benin, nwa amadị a dị afọ iri anọ na asatọ buzi onye na-ewu karịa etu o si ewubu na Naịjirịa.

Ndị Yoruba bi na Cotonou nwere olileanya na ya bụ ikpe ga-agazi ọfụma.

Gọọmenti Naịjirịa boro Igboho ebubo ịkpa nkata ighasa mba ahụ.

Ha bokwara ya ebubo izo ngwaagha ma ka na-ezoro ezo atụbata ya.

Ha boro ya ebubo ikpalite ụmụ Naịjirịa iwakpo obodo.

Mana ọkaiwu Igboho kwuru na onweghị eziokwu dị n'ebubo ndị a.

Okaiwu Igboho kwuru na ihe ka ha mma bụ ka aghara akpọlata Igboho na Naịjịrịa.

N'ọnụ ya. ọ ka mma ka Igboho nwụọ na Cotonou kama ịkpọlata na Naịjiria.