You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Justin Chukwudi Olewuezi: E si m Aboh Mbaise dị n'Imo steeti gaa mahadum Russia mabute 5.0 CGPA
Ebe ọ bụla ịgara mana ịhụghị onye Igbo, gbalaga!
Nke a bụ okwu si n'ọnụ Justin Chukwudi Olewuezi bụ nwafọ Naịjirịa mbụ gụchara mahadum Siberian State Medical University, Tomsk, dị na Russia.
Olewuezi bidoro wuwe na soshal midia dịka ọ mabutere akara 'Cumulative Grade Points Average' ruru 5.0 bụ ogo ngwụcha nke kachasịnụ na mahadum ahụ nke ndị beke na-akpọ 'first class' garuru n'isi mmiri.
Nke a mere ka ọ bụrụ onye mbụ mabutere akara a kamgbe mahadum ahụ dị afọ 133 malitere n'afọ 1888.
Ọ gwara BBC Igbo na agbanyeghị na olere ule Jamb ma nwete akara di mma, o nweteghị ohere ịgụ akwụkwọ na mahadum ndị dị na Naịjirịa.
O kwuru na ogbe Siberia bụ ebe ọtụtụ ndị isi ojii ebighị mana nke a egbughị mmụọ ya ịchusi ike ihe ọ na-achụ.
N'ọnụ ya, " mgbe m na-agụ akwụkwọ na Airforce Secondary School Enugu, e soghị m na ndị chakere achake mana eruru na mba Rọssia , soro usoro agụmakwụkwọ ha were malite chakewe nwayọ nwayọ."
"Ugbua m gụcharala na mahadum Rossia, ọ dịghị m ọsịsọ ịlaghachị ala Naịjirịa makana o nwere orụ m ji ugbua na mba Rọssia. M rụcha ya m kwado ịlaghachi Naijirịa"
Ndịche dị na'etiti agụmakwụkwọ na Rọssia nakwa nke Naịjirịa
Olewuezi kwuru na agụmakwụkwọ na mba Rossia dịwaganyere onwe ya mfe.
N'ọnụ ya, 'ndị nkụzị m na Rọssia na-ewetuọbị kọwara anyị ihe mmụta ọfụma nke mere na ọ na-edo onye ọbụla anya."
"Ihe m nụrụ maka ndị nkuzi mahadum Naijirịa bụ na ọ naghị adịcha ofele ụmụakwụkwọ ha inweta ihu ha gbasara ihe ọmụmụ."
Onye wụ Justin Chukwudi Olewuezi?
- Olewuezi bụ nwafọ Abo Mbaise n'Imo steeti dị na Naijirịa.
- Ọ dị afọ iri abụọ na isii(26 )
- Ọ gara ụlọakwụkwọ praimarị n'Abuja
- Ọ gụrụ akwụkwọ sekọndịrị na Airforce Secondary School Enugu
- A mụrụ ya n'Abuja dị na Najirịa
- O nwetere akara 247 n'ule Jamb mbụ o lere ma nwete 260 na nke abụọ o lere, mana e weghị ya na mahadum Naịjirịa.
- Ọ gara mahadum na "Siberian State Medical University," Tomsk, dị na Russia
Etu Chukwudi Olewuezi si too na Naịjirịa
Olewuezi bụ nwa nke ikpeazụ n'ezinụlọ nne na nna ya kwuru na o sighị n'ezinụlọ bụ akajiakụ na Naịjirịa kamana mama ya ejighị agụmakwụkwọ egwu egwu.
N'ọnụ ya, "nne m nwereike ọ gaghị azụtara gị ọtụtụ akwa mana ọ ga-agba mbọ hụ na ọ zụtara gị akwụkwọ ọbụla dị mma ga-abara gị uru."
"Nnem so mee ka m bụrụ ihe m bụ taa."
Ndụmọdụ Olewuezi na-enye ndị ntoroọbịa
O kwuru na ọ dị mkpa ka ndị ntoroọbịa chụsie ike ihe ọbụla dị mma ha kwenyere na ya.
O kwuru na agbaneghị ọgbatauhie nwereike ịbiara onye ahụ, "gaa n'ihu zọta oke dị mma." Akwa gụọ gị ka ị nọ na njem ahụ, bepụta ya, iwe iwe gị, gosi ya, ihe mkpọbị ụkwụ mee gị tichiasia onwe gị ma gawa n'ihu,
"Ị ga-enwe mmerị."