'Ihe ndị gọvanọ ala Igbo na ndị agha Naịjirịa bịara mee n'Engwu bụ ite ude'
Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ala Igbo, ọkacha ndị otu kwụụru onwe ha Bekee kpọrọ Civil Society Organisation a tapịala isiokwu pụtara n'ọgbakọ ndị isi ọwụwa anyanwụ na ndị isi agha Naịjrịa nwere n'Enugwu ụnyaahụ bụ Sọnde.
Onyeisi ndị 'Human Right Volunteer Corpe' bụ Larry Oguego si na ya bụ ọgbakọ bụ "Ite okwu ude".
Oguego sị na ya bụ ọgbakọ dịka iyi ndị igbo egwu dịka gọomentị etiti dunyere ndị isi agha ha ka ha bịa kpaa udo n'ala Igbo.
Ọ sị "na-ejighị egbe na mma akpa udo. Ọ bụrụ na gọomentị chọrọ ịkpa udo n'ezie na ha kwesiri ịkpọ ndị mmadụ nkịtị ka ha kwuo uche ha gbasara ihe na-eme".
Ọ kpebiri na nke a ha mere abụghị ikpe udo kama ọ bụ ite ya bụ okwu ude.
Ọ kọwakwara na udi ndị agha so Gọvanọ Uzodimma bịa Enugwu dị ka ọ bụ agha ka ana akwado.
Oguego sị na "nke a gosiri na egwu dị n'obodo".