Fr Mbaka: 'Ọchịchị Jonathan chiri 'insecurity' Igwe na Naịjirịa '
Ụkọchukwu Katọlik na-elekọta ụlọekpere 'Adoration Ministry' dị n'Enugwu, bụ Ejike Mbaka ekwuola na ọbụghị ọchịchị onyeisiala Muhammadu Buhari kpatara ọnọdụ nchekwa ji akawanye njọ na Naịjirịa.
Mbaka kwuru na ọ bụ mgbe Goodluck Jonathan bụ onyeisiala ka ọnọdụ nchekwa ọjọọ na-achị dịka eze.
O kwuru nke a n'ụbọchị Wenezde oge ọ na-aka ụka ntụ.
Cheta na ndị ụka Katọlik niile wepụtara ụbọchị Wenezde iji yie akwa ojii ma ruo ụjụ maka oke ọbara ndị omekome na-akwafu na Naịjirịa.
Ndị Katọlik mekwara ngagharị ekpere n'Enugwu n'ụbọchị Wenezde maka ihi nke a.
Bishọp Enugwu bụ Callistus Onaga sokwa yiri akwa ojii oge e mere ngagharị ekpere ahụ.

Ebe foto si, Facebook/Adoration Ministry Enugu Nigeria
Mbaka kwuru sị: "Tupu Jonathan na-abata, 'insecurity' ebidogo."
"Jonathan wee bazie ya eze, kpunye ya okpu, (tupu) Buhari rịbatazie na ya."
"Mgbe e chiri (nchekwa ọjọọ) igwe bụ mgbe Jonathan, Buhari dị nnọọ ka Onowu. Ọ Jonathan ha bụ Igwe."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: