'Agbalahụrụ m ọnwụ n'aka ndị gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Amandugba, Imo steeti'

Aha onyonyo, 'Agbalahuru m ọnwụ n'aka ndị gbara ụlọọrụ ndị uweojii n'Amandugba, Imo steeti' -

Nwa amadị gbapụtara n'ọnụ ọnwụ n'aka ndị omekome gbara ụlọọrụ ndị uweojii ọkụ n'Amandugba dị n'Okpuruọchịchị Isu dị n'Imo steeti agwala BBC Igbo ihe ọ hụrụ ụbọchị Mọnde, abalị 31, nke ọnwa Mee, afọ 2021.

Ya bụ nwaamadị na-achọghị ka a kpọọ aha ya sị na anya ya hụrụ ntị ya ụbọchị ahụ.

Ọ sị na ya dugara nwanne ya nwaanyị ozi n'Amandugba mgbe ya zutere umuokorobia gbara agba bucha egbe nọchie ụzọ ya bụ ime obodo.

Ọ sị na ha kwụsiri ya jụwa ya ebe ha na-aga, "ka ọ bụ na ha amaghị na e nwere ọnọdụ onye apụla ezi taa?"

Ọ sị na mgbe ya kọwachaara ha, o chipuru n'ike gbapụ ọsọ.

Ọ nọzị ebe o zoro hu mgbe ndị omekome malitere ịkụka ụlọmkpọrọ dị na ya bụ ụlọọrụ ndị uweojii ahụ, chụpụchaa ndị mkpọrọ nọ ebe ahụ, mụnye ya ọkụ.

Mana ya bụ nwaamadị gwara BBC okwu sị na o nweghị ndị uweojii nọ ebe ahụ mgbe ha mụnyere ọkụ ebe ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'imo steeti bụ Bala Elkana kwetara na a wakpọrọ ya bụ ụlọọrụ ndị uweojii n'Amandugba mana ha chụpụrụ ndị omekome ahụ.

Bala Elkana sị na ndị mwakpo ahụ ji otu ụgbọala Sienna, Avalon na ọgbatumtum asatọ gaa ebe ahụ bụ ebe ha na ndị ọrụ ha kwakọtara mgbọ.

Ọ sị na ndị ahụ ji egbe ahụ amaghị ndị ha bụ jizi ohere ahụ tụba ọkụ n'ụlọ ebe ihe akaebe ndị uweojii na-adị mgbe ndị ọrụ ha na-akwa ha mgbo n'isi.

Ọ sị ndị obodo nyeere ndị uweojii aka gbanyụọ ya bụ ọkụ ndị ahụ tinyere.

Elkana sị na o nweghị onye nwụrụ na ya bụ ọgbaaghara, ebe ha meruru ọtụtụ ndị omekome ahụ ahụ.

Gee olu ya bụ nwaamdị ebe a.