You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Biafra Sit-at-home: Anyị achọghị nkwafu ọbara ndị aka ha dị ọcha echi - Nnamdi Kanu
Nnamdi Kanu bụ onyendu ndị Indigenous People of Biafra (Ipob) adụọla ndị otu ya ọdụ gbasara nọrọ n'ụlọ (sit-at-home) a ga-eme n'ụbọchị Mee 31, maka ncheta ndị nwụrụ n'agha Biafra.
Kanu gwara ndị otu ya sị "Achọghị m ihe ga-eme ka e nwee mwakpo ọbụla echi, m na-akatọ ya (mwakpo) kpam kpam.
"Anyị achọghị nkwafu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ya mere m ji asị ka onye ọbụla jide onwe ya aka, na-asịkwa ka ndị mmadụ kwanyere ndụ ihe karịrị mmadụ nde ise nwụrụ ka anyị wee dị ndụ ugwu".
Kanu kwuru nke a ka ọ na-ekpe ekpere Ncheta Biafra n'ụtụtụ Sọnde, kwukwara sị na ọ chọghị ka ahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọọrụ na ebe ndị ọzọ mepee n'Ala Igbo ma ncha n'ụbọchị Mọnde.
O kwukwara sị "Ị chọọ ịdị ndụ, apụtakwala echi n'ihi na ndị iro anyị nwereike igbado ụkwụ ebe ahụ wee bido ihe ha na onwe ha enweghi ike ịchịkwata.
"Anyị achọghị ka mmadụ nwụlahụ anyị ma echi ma taa, ya mere m ji arịọ onye ọbụla ka udo chịa dịka anyị na-echeta ndị nwụrụ n'ihi anyị."
Biafra Remembrance Countdown: Lee ka Enugwu na Umuahia dị taa
Dịka taa bụ Mee 30 bụ ụbọchị ncheta agha Biafra, lee etu ụfọdụ mpaghara Ọwụwa Anyanwụ dị.
N'agbanyeghi na ụfọdụ ndị na-achọ nnwereonwe Biafra kwechiri na ha ga-eme nọrọ n'ụlọ taa, ndị ọzọ dịka otu Ipob kwuru na ha ga-eme nke ha echi bụ Mee 31.
Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ ndị na-agara mkpa ha, ebe ndị ọzọ si taa bụ Sọnde nọrọ n'ụlọ na-echebiri ihe ụbọchị ga-eweta.
N'Enugwu,
Ụfọdụ ndị mmadụ na-agara mkpa ha, ụfọdụ si ụka na-alọta.
Ụfọdụ ụzọ tọgbọ chakoo.
N'Umuahia nke Abia steeti,
N'agbanyeghi na ọsọ gbara n'ụmụahịa dịka ndị omekome mụnyere 'State CID' ọkụ, ụfọdụ ndị mmadụ apụtakwala na-agagharị mkpa ha.
Ahịa azụghị n'Owerri, Abakaliki nọ ka onweghi ihe na-eme n'ụbọchị 28 nke ọnwa Mee
Ngwụcha izu a ka emume Ncheta Biafra (Mee 30) ga-adị.
Ọtụtụ otu na-agba mbọ maka nwere onwe Biafra mapụtara etu ha ga-esi eme ya bụ emume.
Otu Ipob higharịrị ụbọchị nke ha gaa ụbọchị Monde bụ Mee 31, ebe ndị ọzọ kwechiri na ọ bụ Mee 30 ka ha ga-emerụba ya bụ emume.
BBC Igbo gagharịrị n'ụfọdụ ebe n'Ala Igbo ụbọchị Fraide were hụ na a nụwala isi anwụrụ etu emume ahụ ga-esi ga na ngwụcha izuụka a.
Owere isiobodo Imo steeti na-apị mbazụ dịka naanị mmadụ ole na ole nọ n'ụzọ dịka ndị mmadụ na-akwado mmemme icheta ndị nwụrụ n'Agha Biafra ihe karịrị afọ 50 gara aga.
Onye ntaakụkọ BBC gagharịrị n'Owere ụbọchị Fraide, kwuru na ọtụtụ ndị ahịa apụtaghị n'ihi iwu nọrọ n'ụlọ nke otu Indigenous People of Biafra (Ipob) tinyere ndị otu ha.
Ụlọakwụkwọ emepeghị n'ihi egwu ihe ntụmadị nwereike ịpụta maka iwu ahụ ipob tinyere.Ọtụtụ ọdọahịa dị n'okporoụzọ a ma ama n'Owere emepeghị.
Ndị gwara onye ntaakụkọ BBC okwu sị na ọ kaara ha mma ịhapụ ebe ha na-achụ ihe afọ ga-eri karịa na ha danyere na nsogbu ha amaghị.
Mana ndị uweojii steeti ahụ kwuru na ha zuru ka emee n'ichekwa steeti ahụ.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Bala Elkana, gwara onye ntaakụkọ anyị na ndị ọrụ nchekwa ga-awa ndị Ipob ọbụla kpara aghara agba.
Kọmịshọna mgbasaozi na steeti ahụ bụ Declan Emelumba, kwukwara na gọọmentị steeti ahụ na ndị ọrụ nchekwa ga-ejikọ aka ịhụ na otu Ipob ebuteghị ọgbaghara n'oge a.
N'Ebonyi, ebe niile na-ekpo ọkụ ka ọ na-adị
N' Ebonyi steeti, o nweghị ihe gosiri na ndị mmadụ dị njikere isonye n'iwu 'nọrọ n'ụlọ' Ipob tinyere maka ncheta Biafra dịka ndị mmadụ na-agara mkpa ha.
N'Udensi Roundabout, ụgbọala na-agara onwe, ebe ndị nwere ọdọahịa nakwa ụlọọrụ mepere.
Ndị ọrụ oyibo gakwara ọrụ.
N'Ihitte Uboma
Ndị mmadụ na-agara onwe ha mkpa ha.
Odakwụkwọ ahotu ndị ahịa lmo Rescue Market, dị n' Obowo bụ Prince Ahamefule gwara BBC Igbo na ọ bụ iwu gọọmentị nyere ha ka ha ga-ege , na ọ bụghị otu Ipob.
Ụbọchị Monde, a hụrụ ndị ji gara zụọ osikapa, agwa na iji n'ahịa ahụ n'ihi egwu dịka kepukepu kwuru na ahịa agaghị azụ maka mmachị 'nọrọ n'ụlọ'.