You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị ji egbe egbuola ndị uweojii ise n'Okigwe
Ọnụ na-ekwuru ndi uweojii n'Imo bụ Godson Orlando Ikeokwu kwuru na ndị uwejji ise nwụrụ dịka a na-achọ otu onye uweojii achọ dịka ndị ji egbe wakporo isi ụlọ ọrụ ndị uweojji n'Okigwe South.
Maazị Ikeokwu sị na agaghị ụlọ ọrụ ndị uweojii ahụ ọkụ.
Nke na-abịa ka o mechara ụbọchị abụọ ndị ji egbe wakporo be aka na-achi Imo steeti bụ Hope Uzodinma n'Omuma ma mụnya mpaghara ya ọkụ.
Ọ bụkwa otu ụbọchị ndi ji Ebe gbụrụ ndi uweojii, Kọstọm na ndị agha na mwakpo ha mere na Rịvas steeti.
Ọ gụnyere na mwakpo a na-eme ndi ọrụ nchekwa aghara aghara na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa nke buterela ogbugbu ọtụtụ ndị ọrụ nchekwa nakwa ịgba ụlọ ọrụ ha ọkụ.