Kwara: Ndị Ụka Alakụba na nke Kraịst na-alụ ọgụ maka ịchafụ hijab n'Ilorin
Gọọmentị Kwara steeti ekwuola na ọ bụ ha nwee ụlọakwụkwọ nile dị na steeti ahụ.
N'ozi Gọmentị ahụ wepụtara na Twitter nke Odeakwụkwọ steeti ahụ Saba Jubril binyere aka, ha kwuru na kemgbe afọ 1974 oge gọọmentị steeti ahụ weghara ọtụtụ ụlọakwụkwọ n'aka ndị ụka na ndị nọrọ onwe ha.
N'ihi nke a , ha gara n'ihu kwuo sị, na ọ bụ gọọmentị nwe ma na-ahazi etu ihe si aga n'ụlọakwụkwọ ndị a niile dịka o siri metụta ndị na-arụ na ya nakwa ego e ji ahazi ha.
Gọọmenti steeti ahụ gara n'ihu kwuo na ụlọikpe ajụla ndọrọndọrọ na ọ bụ ndị ụka Alakụba maọbụ ndị nke Kraist nwe ụlọakwụkwọ ndị a.
Kwara: Ndị Ụka Alakụba na nke Kraịst na-alụ ọgụ maka ịchafụ hijab n'Ilorin
Ebe niile na-ekpo ọkụ ọkụ na Kwara steeti dịka ndị ofufe Alakụba na nke ndị Kraịstị na-ese okwu banyere ụmụnwaanyị iyi uwe hijab na ụlọakwụkwọ ndị ụka.
Ndị ofufe abụọ bara onwe ha ọgụ n'ụtụtụ Wenezde dịka a na-eme ngagharị iwe maka mmepe ụlọakwụkwọ iri ndị ụka nwe agbachiri maka nsogbu a.
Gọọmentị steeti a gbachiri ụlọakwụkwọ iri a n'ọnwa Febụwarị iji kpezie esemokwu a nne na nna ụmụakwụkwọ ofufe Alakụba na ndị nwe akwụkwọ ụka.
Ndị ụka ahụ si na ha anabataghị ụmụakwụkwọ nwaanyị ipuchi isi dịka ofufe Alakụba kwuru.
Gọọmentị kagburu iwu ha enyeburu ka agbapee ụlọakwụkwọ ndị a na Maachi maka egwu na o nwereike bute ọgbaghara.
Nne na nna ụmụakwụkwọ ndị ofufe Kraịst sị na iwu gọọmentị mejọrọ atụmatụ eji hibe ụlọakwụkwọ ndị a.
Mana gọọmentị Kwara sị na ihe ọ na-eme bụ ichekwa ikike dịri mmadụ niile nọ na steeti ahụ.


