DNA Test: Ọtụtụ ụmụnwoke bịara ịlụ m na-agba ọsọ maka na amaghị m nna m- Vivian Umeh
Nwada Vivian Umeh sị na nna ya bụ onye Ibadan ebe nne ya bụ onye Igbo mana kamgbe afọ iri anọ gara aga na ọ maghị onye bụ nna ya.
Ọ sị na maka na ọ maghị nna mụrụ ya mere ọtụtụ ụmụnwoke ndị bịarala di na-agba ọsọ ma ha chọpụta nke a.
N'ihi nsogbu a mere Vivian ji zọpụ njem ịchọ onye bụ nna ya.
Vivian nwere akara ọdịnala ndị Oyo Steetị nke ala Yoruba mana ọ naghị asụ asụsụ maka na a zụrụ ya n'ala Igbo.
Mgbe Vivian bịara ịchọ nna ya ka o zutere otu nwoke kụrụ ya dịka nwa ya ma na-enyere aka na njem ịchọ nna ya.
Ọtụtụ ndị abịala sị na Vivian bụ nwa ha mana akụkọ ha na-akọ dị iche na nke Vivian kọọrọ.
Gee ihe o kwuru n'uju;
Akụkọ ndị ga-amasị gị:
