You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
DNA Test: Ihe ise atụmatụ a nwereike ịgwa gị maka nwa gị
Dịka nyocha DNA bụ ihe a kpụ n'ọnụ ugbua, ọtụtụ mmadụ amaghị na o nwere ihe ndị ọzọ eji nyocha a achọpụta na-abụghị naanị maka nna mụrụ nwata.
Dịka onye maara anya nyocha DNA si gwaa BBC na ihe ndị Afrịka ji emekaarị nyocha DNA bụ naanị ịmata nna nwe nwata mana ihe a bụ otu n'ime ihe ndị e ji ya eme.
Dọkịnta Ayodele Adeniyi bụ onyeisi ngalaba 'Paternity Test Nigeria' sị "Ndị mmadụ anaghị ekwe iwepụta ọtụtụ ego mee nyocha a ma ọ bụghị ịmata onye bụ nna nwe nwata".
Mana ọ bụghị naanị maka ịmata nna nwe nwata ka e ji eme nnyocha 'DNA'.
Ọ sị, "E nwere ọtụtụ ihe nnyocha 'DNA' na-ekpuhe maka nwata."
Nnyocha DNA na ihe ndị ọ na-ekpuhe
- Nnyocha DNA (DNA paternity) nke nna na-egosi ma nwoke ọ bụ ezinna nna mụrụ onye ọzọ, a na-eji asụ mmiri si n'akụkụ nti eme nyocha a.
- Nnyocha DNA nke nne (DNA Maternity) ga-enye aka ka ị chọpụta agbụrụ gị ruo ebe nne mụrụ gị nọ, nne mụrụ nne gị nakwa nne nne ochie gị maka ido anya.
- Nnyocha DNA nke ụmụnne (DNA Sibling) nke ga-eme ka ị mata ma gị na ụmụnne o si n'otu nne na nna.
- Nnyocha nke Di Y-DNA nke a bụ nke emekaarị naanị ụmụnwoke iji chọta agbụrụ ha ruo ebe nna nna ochie ha nọ.
- Nnyocha a kpọrọ Autosomal ga-agwa gị ozi dị mkpa banyere mkpụrụ ahụ gị ruo ọgbọ anọ maọbụ ise nke ezinaụlọ gị.
- Ihe nnyocha DNA na-egosi bụ ma o nwere ọrịa dị n'agbụrụ onye ahụ dịka ọrịa kansa dị iche iche. Ọrịa kansa a na-ejikaarị nyocha DNA achọpụta bụ BRCA 1/BRCA 2 nke mkpụrụ ndụ.
Gịnị bụ 'DNA'?
'DNA' pụtara 'Deoxyribonucleic acid' bụ mkpụrụ mọlekụl nwere ozi na akụrụngwa niile dị mkpa e ji akpụ mmadụ.
A na-eji 'DNA' amata nne na nna mụrụ mmadụ maọbụ agbụrụ mmadụ si.
Ihe niile dị ndụ ma mmadụ, anụmanụ na ahịa, osisi nwere 'DNA' n'ime ha. Ọ bụ akụrụngwa kachasị obere na-akọwa agbụrụ ihe ndị a.
Ọ pụtara na ọ bụrụ ihe nwere ndụ mụta nwa maọbụ mịta mkpụrụ, ọ ga-eji otu ọkara DNA o nwere nyefee nwa maọbụ mkpụrụ ahụ ọ mịtara, iji hụ na ọmụmụ na-aga n'ihu.
Uru nnyocha 'DNA'?
O na-enye aka inweta nwata n'ụzọ iwu si kwadoo, nakwa iketa oke n'ezinaụlọ.
A na-ejikwa ya achọpụta ọrịa dị n'agbụrụ nwereike imetụta ahụike ruo oge dị anya.
Ego ole ka e ji eme nnyocha 'DNA'?
Dọkịnta Ayodele Adeniyi nke ụlọọrụ 'Paternity test Nigeria' sị na e nwere nnyocha 'DNA' dị iche iche.
Nnyocha 'DNA' nke inwe udo mkpụrụobi a kpọrọ 'Peace of Mind DNA Test'.
Ọ sị na nke bụ ndị otu onye na-eme na ọ na-efu ego dịka otu puku narị (N100,000) gbakwụnyere ya puku iri ise (N50,000) maka onye ọzọ chọrọ ime.
Nke bụ na nna abụọ na otu nwata chọrọ ime nnyocha na ọ ga-efu ha otu puku narị na puku iri ise (N150,000).
Nnyocha maka iwu bụ 'Legal Testing' bụ maka inwe ikike ịkọrọ nwata, iketa oke maọbụ nnyocha ọzọ iwu kwadoro.
Dọkịnta Adeniyi sị na ụdị nnyocha a na-efu otu puku narị na puku iri isii (N160,000).