Amaghị m na isi nwa m ga-esi n'ahụ niile a wara ya pụta - Chinaecherem Okachukwu
Chinaecherem Okachukwu bụ nne Miracle Zinachimdiebube Okachukwu, akọwaala ihe nwa ya gabigara n'ụlọọgwụ dịka a na-achọ ịzọ ya ndụ.
Zinachimdiebube bụ nwa a mụkworo amụkwo nke Bekee kpọrọ "pre-term baby", nke mere ka e jiri ngwaọrụ ahụike dị iche iche chekwaa ya oge a mụrụ ya, iji zọọ ndụ ya.
Chinaecherem nne ya, gwara BBC Igbo na ọ maghị na isi nwa ya ga-emecha pụta dịka a wara ya ahụ ọtụtụ oge.
Ọ kọwara etu ọbara mgbali elu na "preeclampsia" ọ rịara oge ọ dị ime Zinachimdiebube si mee ka a waa ya ahụ wee kupute ya ọsịsọ.
A mụrụ Zinachimdiebube n'ọnwa asaa, ka ọ ha 0.75kg n'ibu.
Lee ihe nkiri a ka ị nụ akụkọ a n'uju:
Ndị mere akụkọ a bụ Chioma Obianinwa na Nnamdi Agbanelo.