You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe anyị ma maka ọgbaghara dapụtara na Ladipo
Ọ bụ na ehihie ụbọchị Monde ka akụkọ pụtara gbasara mwakpo na-aga n'ihu n'ahịa Ladipo dị na Legọs steeti.
Ihe onyonyo gosikwara ebe ndị na-azụ ahịa gbahapụrụ ọdọ ahịa ha na-agba ọsọ ndụ ebe mgbọ na-ada kwa na ya bụ onyonyo.
BBC Igbo gbara otu onye hụrụ ihe na-eme bụ Chuka Mbah ajụjụ ọnụ o were gbaara anyị ama.
O kwuru na ọgbaghara dapụtara n'etiti ndị agboro na ndị na-anya ọgbatumtum akpọrọ "Okada"
"Ndị agboro bu mma na ndị agha pụtara ị gbali egbe elu".
"Ha gwara ndị Okada nọ ebe ahụ ha malite ịkwụ otu puku naira kwa ụbọchị mana ndị Okada jụrụ"
"O nwere otu nwoke m na-azụ ahịa na nke ya agbara egbe n'afọ, eburula ya gawa ụlọọgwụ mana amaghị m ma ọ ka dị ndụ ma ọ nwụrụ anwụ" ka o kwuru.
Onyeisioche na-ahịa ahụ na ndị agha na ndị uweojii gbachara izu gwazaia ndị mmadụ ha gbapee ọdọ ahịa ha.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na Legọs bụ Muyiwa Adejobi kwuru na o nweghi ihe ọ ma maka ihe ahụ mere.
"O anụbeghị m ihe mere mana aga m eme nchọpụta ma zaghachi unu" ka ọ gwara BBC Igbo n'ekwentị.