You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nchekwa n'Alaigbo: Gịnị na-eme na kọmitii nchekwa nke ndị ọwụwa anyanwụ?
Ndị nọ na kọmitii nchekwa nke ala Igbo ekwuola ihe n'eme na ya bụ ime mkporo.
Okammụta Uzodinma nke Alaigbo Development Foundation(ADF) bụ onye otu ya bụ kọmitii ya na onyeisioche ya bụ kọmiti bụ Ọchịagha Obi Umahi (lagoro ezumike) kọwara ọnọdụ ya bụ kọmitii ugbua.
Ndị nọ na kọmitii nchekwa nke ala Igbo ekwuola ihe n'eme na ya bụ ime mkporo.
Okammụta Uzodinma nke Alaigbo Development Foundation(ADF) bụ onye otu ya bụ kọmitii ya na onyeisioche ya bụ kọmiti bụ Ọchịagha Obi Umahi (lagoro ezumike) kọwara ọnọdụ ya bụ kọmitii ugbua.
Gee Maxwell Ozoaka ntị n'olu
N'izu gara aga ka Nwali sị na ya bụ Kọmitii pụọ sị na ya arụjuola maka ọbụghịzị ihe ekwe na-akụ ka ha agba,
Obi Umahi n'onwe ya sị na ọnweghị ebe Nwali gara maka na kọmitii o so na ya bụ "adhoc" kọmitii rụchagoro ọrụ ha gbasaa.
Mana onye ọzọ bụkwa onye otu ya bụ kọmitii bụ Maxwell Ozoaka bụ onye ọkaikpe na-akọwa na ya bụ kọmitii abụghị "adhoc' kama na ọ bụ "expanded nakwa standing".
Sụpịrị sụpịrị a pụtara na ya bụ kọmiti arụchabeghị ọrụ ha kama na ha na-eche ka ndị gọvanọ nye ha ntuziaka gbasara akwụkwọ ha zigara ha.
Ọ na-akọwa na ya bụ kọmitii enweghi ike ịrụcha ma ha agwaghị ndị Igbo ihe ha rụpụtara.
Maxwell kwara arịrị na ndị Gọvanọ Alaigbo anaghị eme ihe ndị mmadụ chọrọ, kama na ha na-eme ihe dị ha mma.
Ọ dọrọ ha aka na ntị sị na " ị hapụ ọrụ chukwu sị gị rụwa, na ị ga-aza Chukwu ajụjụ".
Ozoaka sị ọ bụ maka udi mgbawa obi ha na-enwete n'aka ndị isiọchịchị ala Igbo ka ya na ọnwe ya jikwa gbaa arụkwaghị m n ayu bụ kọmitii.
Ndị na-achị Alaigbo ejighị ihe anyị na-ekwu maka nchekwa Alaigbo mee ihe
Ọkammụta Uzodinma Nwala bụ onyeisi Alaigbo Development Foundation akọwala ihe mere o ji gbaa rụkwaghịm dịka otu n'ime ndị kọmitii e hiwere maka nchekwa ala Igbo.
Ọ sị na ihe mere o ji mee nke a bụ na ndị gọvanọ ala Igbo ejighi ihe kọmitii a wepụtara maka nchekwa ala Igbo kpọrọ ihe.
Nwala sị na ihe e jiri hiwe komitii ha bụ ka ha wepụta usoro nchekwa zuru ala Igbo ọnụ dịka nke dị Yoruba bụ "Amotekun", bụ nke ha gbara mbọ depụtara usoro ndị a site n'enyemaka ndị obodo, ndị ụka nakwa ndị isi ọdịnala dị iche iche.
Mana ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ bịaziri kwuo na ihe ha chọrọ bụ uweojii obodo a kpọrọ 'Community Policing'. Kwuo ka Steetị ọbụla hiwe nchekwa nke ha.
Na ndị gọvanọ a ji ụkwụ zọchie akwụkwọ niile kọmitii ha dere banyere usoro a ga-eji hiwe nchekwa zuru ala Igbo ọnụ.
Nwala sị na nke a megidere ihe bụ isi isekpu ntị e ji hiwe ha dịka kọmitii nchekwa ala Igbo na ọ bụ ya mere o ji gbaa arụkwaghịm.
Nke a pụtara na nwa ha bịara iku dịka kọmitii e hiwere maka nchekwa ala Igbo anwụọla.
Ihe ndị ọzọ ọ kpakwasịrị ụkwụ gụnyere etu ndị ọchị ehi si awakpo ọtụtụ obodo dị n'ala Igbo na e nweghi ihe ọbụla a na-eme ha.
Na ndị ọchị ehi a ehiwechala ebe obibi dị iche iche n'ime obodo ndị dị n'ala Igbo
Ọzọkwa bụ ihe mere n'Emene Enugwu Steetị bụ ebe ndị nchekwa na ndị otu Ipob kwasuru onwe ha nke e gburu ụfọdụ mmadụ gụnyere ndị Ipob na ndị nckekwa.
Nwala nyere ndụmọdụ sị ka ụmụafọ Igbo jụọ ndị ọchịchị a ọkachasị ndị gọvanọ ese maka ọnọdụ nchekwa n'ala Igbo.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: