Mkpọnala - Egbe ike na-emete mmụọ na mmadụ n'ụra

Emume ọdịnala ọbụla e mere n'ala Igbo ma agbaghị mkpọnala, mara na ọ bụ emume ụmụaka.

Mkpọnala bụ ụda e ji akọrọ mmụọ na mmadụ na nnukwu ihe na-eme n'obodo.

Akụkụ Igbo ụfọdụ na-akpọ ya mkpọnanị, ndị ọzọ na-akpọ ya ntụnala, ebe ndị ọzọ na-akpọkwa ya egbenduru.

Oge ọbụla ya bụ egbe dara, ụmụ nnụnụ eju ọhịa, ụmụ anụmanụ adaa jụụ, obodo niile edere jijiji.

Uru mkpọnala bara n'omenala Igbo

Akịrịka Jingo, bụ onye e ji ịgba mkpọnala mara na mpaghara Ideato North n'Imo steeti, kọwaara BBC Igbo na ịgba mkpọnala bụ ụzọ e ji ekele Chukwu maka ihe mere n'obodo.

Jingo kọwakwara na ọ bụghị naanị n'ọnwụ mmadụ maọbụ ihe iru uju ka a na-agba mkpọnala, a na-agba ya ma nnukwu ihe ọbụla mee.

Lee uru mkpọnala bara dịka Jingo si kọwaa:

  • E ji ya eto Chukwu ma ihe ọma mee
  • E ji mkpọnala asị onye nwụrụ anwụ laa nke ọma
  • Nnukwu onye ọbịa bịa n'obodo, ọ bụ ụda mkpọnala ka a ga-eji anabata ya
  • A na-eji mkpọnala agbapụ ihe ọjọọ ma gbabata ihe ọma.
  • Na nnukwu mmemme, dịka iri ji ọhụrụ, a na-agbakwa mkpọnala iji gosi na ọṅụ juru ndị obodo obi
  • Ejikwa mkpọnala agbasa ozi. Mkpọnala daa, ndị mmadụ ga-ajụwa ihe na-emenu, oge ahụ ozi ga-eru ha ntị maka ihe ya bụ mkpọnala jiri daa.

Mana Jingo kwukwara na ụfọdụ na-agbakwa mkpọnala iji ya mee ihe ọjọọ.

Kama ọ bụghị ha ga-eji aka ha agba ya n'ihi na ha na-asọ nsị egbe e ji agba mkpọnala asọ.

Ihe e ji agba mkpọnala

Ọ bụ nsị egbe bụ akụrụngwa kacha mkpa e ji agba mkpọnala.

Jingo kọwara na ọ bụ kemịkalụ dị icheiche ka a gwakọrọ ọnụ iji rụpụta nsị egbe.

Nke ọzọ bụ egbe mkpọnala na onwe ya, nke bụ igwe ndị ọkpụ ụzụ na-akpụ.

A ga-ewere nsị egbe sụjuo n'ime igwe ahụ ma were obere aja wụchie elu ya.

Jingo kọwara na ọ bụrụ na awụchighi ya aja, ọ gaghị agba.

Ọ bụ onye ọbụla nwere ike ịgba mkpọnala?

Jingo kọwara na ọ bụ n'aka nna ya ka ya si mụta ịgba mkpọnala.

Mana o nweela ndị bịara ka ya mụgosi ha etu e si agba ya.

Ọ gara n'ihu dọọ aka na ntị na onye aka ya adịghị ọcha anaghị agba mkpọnala.

Jingo kwuru na "nsị egbe na-akpa nnukwu ike, ọ naghị emere onye ọjọọ ebere."

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị: