You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anambra steeti: Ihe mere gọọmentị Anambara ji kwụsị ndị eze 12 ọrụ nwa oge
Gọọmentị Anambara steeti akwụsịtụla ndị eze ọdịnala mmadụ iri na abụọ ọrụ otu afọ maka ime njem buuru gafee steeti ahụ na-anataghị ikike n'aka gọọmenti dịka iwu siri kwuo.
Ndị nkwụsị ọrụ a metụtara gụnyere Igwe ndị Alor, Igwe Mark Anthony Okonkwo, nke Ezinifite bụ Igwe Chukwuma Bob Vincent Orji; nke Igbarịam bụ Igwe Nkeli Nelly na nke Mkpunando, Igwe Alex Edozieuno.
N'akwụkwọ ozi nke Kọmịshọna na-ahụ maka ihe gbasara ndị eze nakwa ihe na-eme n'ime obodo bụ Greg Obi binyere aka, o kwuru na "Gọvanọ enyela iwu ka anapụ ndị eze 12 akwụkwọ ikike ịbụ Igwe otu afọ bido n'abalị iri na otu ọnwa Ọgọstụ."
Obi kwukwara na anapụla ha ikike isonye n'ọgbakọ ndị ezeọdịnala na steeti ahụ ganye oge a ga-elebanyegharị anya na ya bụ okwu.
Nke a na-eme dịka ọgbakọ jikọrọ ndị eze ọdịnala nwere nzukọ ebe ha kpebiri ma tụnye alo ka a taa ndị otu ha mmadụ 13 soro Arthur Eze gaa hụ onyeisiala Muhammadu Buhari na-anaghị ikike site n'aka Gọọmentị ahụhụ.
Cheta na Gọvanọ Obiano kwụsiburu Igwe ndị Ukwulu bụ Igwe Peter Uyanwa, ọrụ dịka Igwe n'ihe metụtara mmekọrịta ya na Arthur Eze na-enwe nghọtahie.