Humble Li Orji, nwa ada na-eritere Naịjirịa olaedo n’asọmpị Taekwando
Humble Li Orji, dị afọ 25 ugbua dị afọ 18 oge o ritere nturu ugo mbụ ya na Taekwando.
Kemgbe ahụ o ritela ntụrụugo 30 nke gụnyere ọlaedo atọ n’asọmpị mba ụwa.
Na mkparịtaụka, Orji kọrọ maka njem ya na Taekwando nakwa etu ụmụnwaanyị ga-esi amụta itinye uche na ihe ha na-eme.
O kwukwara maka ịta ahụ dịka mmadụ iji ya nyere onwe ya ahụ nakwa etu mmadụ ga-eji Taekwando chekwa onwe ya.
Ọrji kọwakwara ihe mere ụmụnwaanyị ji akarị ụmụnwoke na Taekwando.
Gere akụkọ a n'uju.
Onye mere akụkọ a bụ Vining Ogu.


