Chiamaonwu Joy: Eji m eserese m mụtara na YouTube egosipụta omenala Igbo

Aha onyonyo, Chimaonwu Joy: 'Eji m ise ihe egosipụta omenala Igbo'

Chiamaonwu Joy na-ese ụdị eserese a na-akpọ 'hyper realistic drawing'. Ọ kọwala ihe omimi dị n'ụdị ihe ọ na-ese.

Ọ sị na ọ malitere ise ihe mgbe ọ dị naanị afọ isii, na o nweghi ụlọakwụkwọ ọ gara mụta ya kama na ọ bụ n'ịntanet.

Nwada a sị na ọ bụ onye na-ese ihe banyere ọdịnala nke ọ na-eji egosipụta ọtụtụ ihe omimi dị n'omenala Igbo.

Chiamaonwu sị njirimara ihe osise ya bụ okpokoro ejula nke mere o ji pụọ iche na ndị ọzọ.

Ọ sị ihe mere o ji eji okpokoro ejula bụ maka na ọ bụ otu n'ime ihe ndị dibia ji agba afa.

Kirie ihe o kwuru n'uju.

Onye mere akụkọ a bụ Chigozie Ohaka