Ballet Dancer: Lee nwata nwoke ji egwu 'Ballet' gbakasịa soshal midia

Aha onyonyo, Ballet Dance: Etu nwata ji mkpịsị ụkwụ agba egwu ji gbata aka nchawa

Nwata nwoke a na-akpọ Madu Mmesoma Anthony na-agba egwu mkpịsị ụkwụ kọwara ihe kpalitere mmụọ ya igba ụdị egwu ahụ.

Mmesoma sị na ịgba egwu masịrị ya nke ọma na ọ bụ ya mere o ji tinye anya n'ịgba egwu.

Nke ọzọ bụrụ na ọ chọrọ igosi ụwa na ọbụghị naanị ụmụnwaanyị ka a hụrụ kwaa isi okpu n'ịgba egwu 'ballet'.

Ọ sị na ọ na-agba egwu a na ọ na-adị ya ka ebe ọ na-arọ nrọ ọma.

Nne ya bụ Madu Ifeoma kwadoro ya site n'itinye ya n'ebe a na-amụ etu e si agba egwu mkpịsị ụkwụ a bụ 'ballet'.

Kirie ihe ha kwuru n'uju.

Ndị mere akụkọ a bụ: Grace Ekpu, Jessica Nwankwo na Nnamdi Agbanelo