Igbo language: "Ndị na-achị m ọchị anaghị ekwe ka m mụta Igbo"
Otu na-ahụ maka asụsụ na agụmakwụkwọ na mbaụawa bụ United Nations Educational, Scientific and Cultural Organisation (UNESCO) ekwubuola na asụsụ igbo ga-eso n'asụsụ ndị ga-ala n'afọ 2050.
Ebe ụfọdụ na-agba mbọ ịhụ na ihe a abịaghị na mmezu, ụfọdụ achọghịkwa ịma.
Mana ihe na-agba anyammiri bụ na ụfọdụ ndị amaghị asụ asụsụ a, mana obi na-anụ ha ọkụ ịmụta ya ọkachasị ndị a na-amụghị na Naịjịrịa na-ebe akwa arịrị na ndị igbo ibe ha anaghị enyere ha aka ịmụta asụsụ a.
Otu nwada Igbo a mụrụ na mba Ịglandị bụ Diana Ilochi gwara BBC igbo na ọ gbawaala ya obi ọtụtụ oge etu ndị mmadụ siri na-eme ya akaje ma na-achị ya ọchị ma ya sụọ Igbo.
O kwuru na ha chịchaa ya ọchị, ha anaghị akọwara ya ihe o kwesịrị ikwu. Nwada Ilochi kwuru na nke a agbawaala ya obi ọtụtụ oge, wee mee ka o nwee obi ịdamba n'ebe asụsụ igbo nọ.
Lee ihe o kwuru n'uju ebe a.
Akụkọ ndị a ga-amasị gị: