Lockdown in Nigeria: Mba ndị a emepewela: Kedụ ebe Naịjirịa kwụ?

Ụmụ nwaanyị na Legọs

Ebe foto si, Getty Images

N'ime ihe ruru izu isii maọbụ gafee (ka o sila dị) ụfọdụ mba mechiri, mba dị iche iche n'ụwa amalite imepe obere obere, na-alaghachị n'etu ndụ dị tupu ọrịa Coronavirus amalite ịkpa arụ n'ụwa.

Dịka a banyere izu ọhụrụ taa bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Epreelụ, mba ndị gụnyere Gana, Neu Zilandị na ndị ọzọ, sonyere ndị dịka Ọstrelia n'ibuli ụfọdụ mmachi ha tinyere.

Ka ọ dị ugbua, BBC Igbo chọrọ ịchịkọta obodo ndị a, ịkọwara gị ihe mere ha ji emepe na ebe ha meperuru.

Mba ndị mepewerela

1) Gana: Mba a bụ agbataobi Naịjiria mechiri mgbe ọrịa a malitere inye nsogbu, mana ka izu atọ ha ji tinye iwu mmechi a gachara, onyeisiala ha bụ Nana Akufo-Addo ebuliela ya n'ụbọchị 19 nke ọnwa Epreelụ.

Gịnị mere e ji bulie mmechi a?

Naanị mmadụ 19 ka ọrịa Coronavirus a gburula n'ime ihe ruru mmadụ 1,550 butere ya na mba ahụ, ebe mmadụ 155 gbakerela, nke mere o ji sị na ọ gbadoro ụkwụ na nchọpụta sayensị na ndekọ wee sị na ọ baghị uru imechi obodo niile n'ihi ọnọdụ akụnụba obodo.

Kedụ ebe ha meperuru?

Ụlọakwụkwọ na okeala ka gbachiri agbachi dịka a ka machiri inwe ọgbakọ, mana ụfọdụ ụlọ azụmahịa dị iche iche ga na-emepe mana ha ga-agba mbọ hụ na ndị mmadụ nyere ibe ha ohere nke Bekee kpọrọ "social distancing".

Gana

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gana ka machiri ndị mmadụ ịgbakọ n'ọha

Ka ọ dị ugbua, Akufo-Addo kwuru na a ga-arụ ụlọọgwụ 88 n'ime otu afọ na mba ahụ ka ọrịa a gbara ike ha n'anwụ.

2) Chaịna: Onye ọbụla ma na mba a bụ ebe ọrịa Coronavirus a sị selite isi tupu ọ gazuo mbaụwa, mana ndụ alọghachitewela ya ntakịrị ntakịrị.

Gịnị mere e ji bulie mmechi a?

Obodo Wuhan bụ ebe ọrịa a bu ụzọ tikapụta buliri mmachibido ịpụta ezi ha n'ụbọchị asatọ nke ọnwa Epreelụ a ka ọ nọchara na mmechi ụbọchị 76, ka ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a gbadara nke ukwuu.

E buliri mmechi a ịma etu ha ga-esi nyere akụnụba obodo ha aka, ka ọrịa a mere ka akụnụbaobodo ha gbadaa.

Mara na ọrịa a egbuola ihe ruru mmadụ karịrị puku anọ n'ime ihe karịrị mmadụ 84,000 butere ya na mba ahụ.

Kedụ ebe ha meperuru ugbua?

Ka ọ dị ugbua, ụfọdụ azụmahịa emeela, ebe ụfọdụ ọdọụgbọelu nke na-efe naanị n'ime mba ahụ nakwa ụgbọoloko mepekwarala.

Ụmụ akwụkwọ Chaịna

Ebe foto si, EPA

Ụfọdụ ụlọakwụkwọ dị na Beijing na Shanghai emepekwaala dịka ụmụakwụkwọ malitere ịga akwụkwọ taa.

Marakwa na ihe ruru mmadụ 1,290 nwụrụ ka e mepechara obodo Wuhan ọzọ, dịka BBC nọ na Chaịna si kwuo.

3) Nu Zilandị: Mba a banyere na mmechi n'ụbọchị 23 nke ọnwa Maachị ka ọrịa a malitere ịgazu ụwa. Nke bụ na ha nọrọ na mmechi ihe karịrị otu ọnwa na ọma tupu e bulie ya taa bụ ụbọchị 27 nke ọnwa Epreelụ.

Gịnị mere e ji bulie mmechi a?

Jacinda Ardern bụ Praịm Minista mba ahụ kwuru na ha emeriela ya bụ ọrịa "ka ọ dị ugbua" dịka e si n'ịchọta ya n'ahụ ihe karịrị mmadụ iri gbadaa n'ịchọta ya n'ahụ ihe na-erughizi mmadụ iri kwa ụbọchị - ma chọta ya n'ahụ naanị otu onye ụnyaahụ bụ 26 Epreelụ.

Ardern kwuru sị "Anyị na-emepe obodo n'ihi akụnụba, mana anyị anaghị emepe ya maka mmekọrịta na egwuregwu ndị mmadụ"

Kedụ ebe ha meperuru ugbua?

Site n'echi bụ ụbọchị 28 nke ọnwa Epreelụ, ụfọdụ azụmahịa na-abụghị ndị kacha mkpa n'oge a, ndị nlekọta ahụike nakwa ụfọdụ ihe gbasara agụmakwụkwọ ga-amalite.

4) Ọstrelia: Mba banyere na mmechi n'ụbọchị 22 nke ọnwa Maachị, dịka ọrịa a malitere ịgbasa, mana ha malitere imepe ụfọdụ ebe n'ụbọchị 20 nke ọnwa Epreelụ.

Kedụ ebe ha meperuru ugbua?

Na mba a, e mepeela ụfọdụ ọnụ mmiri (beach), bido n'ụbọchị Satọdee na-abịa, obodo dị ka Queensland ga-ahapụ ka ụlọahịa ndị na-ere ihe dị ka akwa na ihe ndị ọzọ mepee.

Ka ọ dị ugbua, ha ewepụtala nke a kpọrọ "Covidsafe contact tracing app" bụ nke ga-egosinwu mmadụ ma ya na onye bu ọrịa a nọrọ nsọ ihe karịrị nkeji 15. Scott Morrisonbụ Praịm Minista sị na ha nwereike ibulicha mmechi a ma ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ but up ya bụ app n'ekwentị ha.

ikperemmiri Ọstrelia

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ostrialia agbapeela ikperemmiri ha

5) Spen: Mba a so na ndị ọrịa a gwọrọ ara ka o rutere ha aka. Mana ugbua isi ha na ha apụta obere obere.

Ha banyere na mmechi obodo n'ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị, mana kemgbe ụbọchị 13 nke ọnwa Epreelụ ha ejirila nwayọ nwayọ na-emepe.

Kedụ ọnọdụ Naijiria kwụ n'ime ihe niile a?

Naijiria anọọla na mmechi kemgbe otu ọnwa na ụma dịka Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị gọvanọ ndị ọzọ tinyere iwu mmachibido.

N'ime izu anọ a, ọtụtụ ndị agabeghi ọrụ nke ahịa dị iche iche ji emepe (a hapụrụ naanị ndị ahịa nri).

Nke a pụtara na akụnụba obodo a na ha akụ afọ n'ala maọbụ ji otu ụkwụ kwụrụ.

Ọdọ ụgbọelu Naịjịria

Ebe foto si, FaanOfficial

Nkọwa foto, Agbachiri ọdọ ụgbọelu niile dị na Naịjịria

N'ime nke a, ụfọdụ etisiwela mkpu ike ka e mepee obodo, mana oge eruola?

Tupu mba ndị a edepụtara n'elu emepewe ha mere ụfọdụ ihe iji chekwa onwe ha.

Ịma atụ, Gana bu ụzọ nyochaa ihe ruru mmadụ puku iri isii tupu ha ekpebie ibuli mmachi a, ebe Naijiria nyocharala naanị ihe ruru mmadụ puku iri. Nke a mere a ga-eji jụọ "Naijiria nwere ihe ruru mmadụ nde narị abụọ enyocharuola mmadụ ole ha kwesịrị inyocha tupu ha amara ma ọrịa eruola etu e nwereike iche?"

Ihe mba ndị dị ka Spen, Ọstrelia na ndị ọzọ hụrụ tupu ha ekpebie ibuli mmachi ha obere obere, bụ na ndị nwụrụ anwụ bịara ruo otu ogogo nke bụ na a bịara nwee mgbe ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa Coronavirus a karịrị akarị, mana o ruchara otu ihe n'ime ihe dị ka otu izu, tupu ọ bịa dawakwa ọzọ.

Ụmụ nwaanyị na ụlọakụ
Nkọwa foto, Ọtụtụ ụlọakụ mechiri Na Naịjirịa dịka mmachị gọọmentị tinyere na-aga n'ihu

Mana ka ọ dị ugbua, enwebeghi ike ikwu ma Naijiria eruola ogogo ahụ ma ya fọdụzịa ịdawa.

Na mba ndị ahụ ugbua, ọnụọgụgụ ndị bu ọrịa a na-adazị ada karịa ogogo o ruburu mbụ, ịma atụ bụ mba Nu Zilandị, mana Naijiria ka nọ na ọ daa taa, ọ rịa echi.