You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kaduna Seminarian: A nwụchiela ndị gburu onye ụkọchụkwu ahụ
Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ha anwụchiela ụfọdụ n'ime ndị ntọọrị wakporo ụlọakwụkwọ ndị Fada dị na Kaduna ma tọọrọ ndị "Seminarian" anọ, nke ha mechara gbuo otu onye n'ime ha.
Ihe a mere n'ụbọchị nke itoolu nke ọnwa Januwarị 2020, n'ụlọakwụkwọ Good Shepard Major Seminary dị na Gonin Gora, na kaduna.
Emechara tọghapụ mmadụ atọ n'ime ndị ahụ mana otu onye n'ime ha aha ya bụ Michael Nnadi nwụrụ.
Ndị uweojii sị na ha ji mmadụ atọ n'ime ndị kpara ike a.
Ndị uweojii dere n'akara Twitter ha na ha ji mmadụ atọ: Tukur Usman, Shehu Bello na Mustapha Mohammed.
Ndị uweojii kwukwara na aka ndị a dị na ntọọrọ atọọrọ nwunye dọkịnta Philip Ataga na Kaduna.
Ha sị na ndị a so n'ime ndị omekome na-akpa ike na mpaghara ugwu.