You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Actors Guild of Nigeria: Ime Sịnetọ Abbo 'patron' dịka ibute nsị n'ime ụlọ - Ụmụnwaanyị Nollywood
Ụfọdụ ndị na-eme ihe nkiri ọkachasị ụmụnwaanyị agbarụọla ihu etu ndịisi otu jikọrọ ndị na-eme ihe nkiri bụ Actors Guild of Nigeria (AGN) ji mee Sịnetọ Elisha Abbo papa ukwu ha.
Nke a dị n'ihe onyonyo nakwa ihe ha depụtara n'akara soshal midia ha bụ ebe ha gbarụrụ ihe maka nke a.
Hilda Dokubo gọsịpụtara iwe site n'ihe onyonyo dị n'akara twitter nke mere BBC Igbo ji gbaa ya ajụjụọnụ iji maka ihe bụ iwe ya.
Dokubo gwara BBC sị na sịnetọ Abbo etozughi oke ịnata ọkwa ahụ maka agwa ọjọọ ọ kpasoro otu nwaanyị n'Abuja n'afọ 2019.
Ọ sị na ọ bụ otu sịnetọ a bụ onye tiri nwaagbọghọ ihe n'ụlọahịa dị n'Abuja na-arịọghị mgbaghara n'ụzọ kwesịrị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ime Sịnetọ Abbo Papa ukwu n'AGN dịka ibute nsị n'ime ụlọ.
Hilda sị na nke ka nke bụ na ndịisi ha emeghi ka ọtụtụ n'ime mara tupu e nye sịnetọ Abbo ọkwa ahụ.
N'otu aka ahụ nwaanyị ọzọ na-eme ihe nkiri bụ Kate Henshaw tinyere ọnụ ya n'okwu a site n'akara Twitter ya.
O kwuru na Elisha Abbo etorughi ịbụ papa ukwu n'otu AGN, ka ọ ghara ịma ụmụnwaanyị akantị.
Mana onyeisi otu AGN bụ Emeka Rollas zaghachịrị ndị a site n'ajụjụọnụ ụlọọrụ ntaakụkọ Pulsetv gbara ya.
Emeka sị na Abbo arịọla mgbaghara maka ịma nwaanyị ụra, na ọ dịghị ndị AGN n'aka ikpe ya ikpe.
Ọ gara n'ihu kwuo na odoghi ya anya ma Hilda na Kate ha so n'otu AGN, na ọ ga-eleba anya n'akwụkwọ ka ọ mara