MRKH Syndrome: Ụbọchị m chọpụtara na m enweghị ọtụ mgbe a mụrụ m

Ị nụtụla na nwaanyị nwere ike o nweghi ọtụ na akpa nwa si n'afọ nne ya pụta ụwa?

Lee Julian Peter, onye Kenya, onye ndị dọkịta kwuru na o nweghị oghere ọtụ, maọbụ akpanwa nwaanyị.

O nwekwaghị ụzọakpa nwa Bekee gboro "Cervix", ma nwekwaa naanị otu akịrị (kidney).

Julian nwere ọrịa Bekee kpọrọ Mayer-Rokitansky-Küster-Hauser syndrome (MRKH).

Ọnọdụ a pụtara na o enweghị ọtụ na akpanwa.

Mgbe ụfọdụ ndị a mụrụ n'ọnọdụ a nwere ike ịnwe otu akịrị.

Nwaanyị ọbụla nwere ọrịa MRKH agaghị ahụ nsọ ya.

Julian kwuru sị: "E nweghị m akpanwa, nke mere na m ahụtụbeghi nsọ m.

"Otu a ka m hụrụ onwe m, ọnweghị ihe ọ pụtaara m.

"Ụfọdụ na-echere m ụdị echiche dị iche iche.

"Ihe ọ sọro uwa ha kwuwe"

Julian chọpụtara ọnọdụ ya oge ọ dị afọ iri na asaa.

Mana ọbụ ka ọ gachara afọ iri na abụọ ọ mechere nchọpụta a ka ọnụ kwere ya kọọrọ onye ọrụ BBC bụ Anne Ngugi ọnọdụ ya.

O kwuru sị: "A chọpụtara m ihe a mgbe m dị afọ iri na asaa dịka nwata akwụkwọ.

"A gara m ụlọọgwụ mgbe ahụ adịghị m, ọkpa m zara aza.

"Ihe mbụ dọkịnta juru m bụ, kedu mgbe ịkpeazụ m hụru nsọ m?

"Enwenụbeghị m ụdị ihe ahụ."

Mgbe Julian kọọrọ ndị mmadụ ọnọdụ ya, ha nyere ya ndụmọdụ dị icheiche.

"Ọnwere onye nke gwara m chọọ ụlọekpere ebe a ga-ekpere m ekwere.

"Onye nke ọzọ sị n'aka nne m ochie dị na ya maka na-eji ịta amusu mara ndị be anyị bụ ndị Ukambani.

"Ha nwere ike ukwu ihe masịri ha, achọghị m ịma.

"Ihe ka m mkpa bụ ka m sị ahụta ya.

"M gewe ha ntị, onyewe m nsogbu, mgbe ahụ ọ dịwa m ka eziokwu adị n'ihe ha na-ekwu."

Nnyocha ndị dọkịta chọpụtara na ụzọ akpanwa Julian si na mpụta mechie.

Ha mechara waa ya ahụ iji mepe akpanwa ya, mana ọnweghị isi.

"Ebere m akwa arịrị abali atọ mechaa mechiere onwe m ọnụ.

"Mụ na nne m, bụ naanị onye m nwere, nọ n'ụlọọgwụ mgbe ahụ.

"Ya bụ ihe riri ya ọnụ.

"A ma m na ọ jụru onwe ya ajụjụ dị omimi maka ya bụ ihe, ịmata ka ọnwere ebe o sị mejọọ."

'A chọghị m ịwa ahụ'

Julian gụrụ Bayọlọgi n'ụlọakwụkwọ mahadum.

Nke a nyere ya nghọta etu ahụ ya si dị.

Ọ gwara ndị dọkịta na ya achọghị ịwa ahụ n'oge ahụ n'ihi na ọ chọrọ ịlaghachị ụlọakwụkwọ je gụchaa akwụkwọ ya.

Mana ka afọ iri gachara, Julian laghachiri azụ n'ụlọọgwụ ga waa ahụ.

O kwuru sị: "A wara oghere ọtụ m awa.

"Onweghị ka ya bụ ihe siri metuta ndụ m maka na MRKH anaghị emetuta ka i si ebi ndụ gị."

Mana ụfọdụ ndị na-arịa ọrịa a na-anọkarị n'oke echiche.

Ọtụtụ n'ime ha na-aga anata ntuziaka n'aka ndị Dọkinta Saịkọlọgị iji nabata ọnọdụ ahụ.

Mana ndụmọdụ Julian na-enye bụ na "ọ bụrụ na ị ghọta ọnọdụ ahụ gị, ịchefụgodu ịmụ nwa."

"E seela m foto imeahụ ugboro anọ mana ọnweghị ehe (ovary) a hụrụ, nke bụ na ọnweghị ka a ga-esi wete akwa n'ime ahụ iji mee m IVF.

"Ọ ka mma ịnabata ka Chi gị si kee gị.

"Mana ịchọpụta na gị na ibe gị abụghị otu adịghị mfe.

"Ọ dị mkpa ịchọta otu onye ị ga-akọsara ụwa gị."