You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Abaribe: 'O nweghị otu mkpụrụ ihe a ga-eji ego mbite a rụọ n'ala ndị Igbo'
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ọ bụghịzị akụkọ ọhụrụ na omeiwu Enyinnaya Abaribe katọrọ usoro ndị ụlọomeiwu ukwu ji kwenye ka gọọmenti etiti bite ego ruru ijeri dọla iri abụọ na abụọ.
Kamgbe ahụ ndị mmadụ na-eto ya n'elu soshal midia.
Abaribe kwusiri ike na ụfọdụ ihe e depụtara bụ ihe kpatara gọọmenti ji ebi ego ahụ adabachaghị ọfụma ma na-ekwu na ọ karị dị mma ọ bụrụ na emere ntụliaka n'ụlọomeiwu gbasara ya.
Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ kwuru n'elu soshal midia
@mrintergrity kwuru na Enyinnaya Abaribe mere ọfụma n'etu o si kwupụta uche ya.
@frediecruze tokwara Abaribe.