You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Enugu LGA Elections: Otu patị 91 na-azọ na ntuliaka n'okpuruọchịchị ime obodo n'Enugwu
Otu patị 91 na-azọ ọkwa isioche okpuruọchịchị obodo n'Enugwu.
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka n'Enugwu steeti bụ nke Bekee kpọrọ "Enugu State Independent Electoral Commission" (ESIEC) amalitela ihazi ntuliaka a ga-eji họpụta aka ga-achị okpuru ọchịchị ime obodo 17 nakwa ọchịchị obodo 261 na Satọde bụ abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Febụwarị 2020.
ESIEC sị na ọ bụ mmadụ 296 na-azọ ọchịchị n'okpuru patị 36 ị bụ aka na-achị okpuru ọchịchị ime obodo nke Bekee kpọrọ "Local Government Chairman".
Ha ekwughi mmadụ ole na-azo ọkwa ị bụ ihe Bekee kpọro "Counsilor" n'ime ọchịchi obodo 261 di n'Enugwu steeti.
Lee ka ntụlịaka a sị aka
Okpuru ọchịchị Udi
Ka ọ dị ugbuaAnyị abatala Udi local govt area n'Enugwu steeti.N'Eke na "End ward" dị n' Udi. ndị mmadụ juputara ebe ahụ na atụ votu, enweghịkwa ọgba aghara ọbụla na ebe ahụ.
N'isi obodo Enugwu steeti
Dịka BBC Igbo hụrụ, n'Enugwu bụ isi obodo steeti ahụ ọtụtụ mmadụ nọ be ha mana ụfọdụ mmadụ na-aga n'ụzọ.
N'okpuru ọchịchị Ogwụ
N'Ọgwụ ndị nchekwa na ndi ọzọ na-aga ọrụ ntuliaka a ka na-eche iburu akụrụmgwa ha ji aga ọrụ n'ụlọ ọrọ okpuru ọchịchị ahụ.
Ntuliaka malitere ka o kụrụ elekere iri na abụọ nke ehihe na Nkwe dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ.
Na Mpaghara ọwụwa anyanwụ Enugwu steeti
Ntuliaka n'Enugwu East na-aga nke ọma oge BBC rutere na ogige ahụ.
Mmadụ anọ na-achịkọta ogige ntuliaka anọ n'Enugwu East Local gọọmenti
Na Amaọrji, akwụrụmgwa eji eme ntuliaka erutela dịka ndị mmadụ na-eso usoro eji eme ya bu ntuliaka.
Ebe nke abuo BBC gara bụ "New Haven Primary School" ebe ogige vootu asatọ dirila njikere imalite ntuliaka.
Foto ndị e tinyere na Facebook na-egosi ebe Gọvanọ Ugwuanyi na-atu vootu n'obodo ya bụ Ohom Orba dị n'okpuru ọchịchi Udenu.
Dị ka o si gaa, ntuliaka okpuru ọchịchị ime obodo Enugwu mere n'udo.
Nchịkọta
Election local gọmenti akwụsịla ugbua n'EnugwuNdị orụ Enugu state independent Electoral commission Ensiec chikọbara ya bụ ntuliaka ejirila nwayọ nwayọ n'ebubata akwụkwọ ejiri tụọ votu.N'Enugwu north Local.Ugbua 'collation' amalitela na ọtụtụ local gọmenti n'Enugwu