You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigerian foods: Onye ọnụ ụtọ, lee etu ị ga-esi sie ụkwa gị ka ọ dọọ ndị ọzọ akpịrị
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
Nri dị nri a dịrị, mana ụkwa so na nri ndị e nwereike ịkpọ 'igwe' n'ala Naịjirịa ọkachasị ala Igbo.
Ọtụtụ ndị na-atụnyere ụkwa na agwa, mana ha abụghị nwanne nke e ji esi otu ụzọ eri ya.
Ebe e nwereike isi ụkwa na-etinyeghi nnu na ose nakwa ṅụọ mmiri ya, anaghị eme agwa etu ahụ n'ihi na ọ ga-enwerịrị ihe e ji elofe agwa.
Ebe ụkwa bụ nri e ji mara ndị Igbo, etu anyị si esi ya emeela ka ọ na-adọ ụfọdụ ndị agbụrụ ọzọ akpịrị.
Lee ụzọ ndị ị ga-esi rie ụkwa gị ọ banye ndị ọzọ n'anya:
1) Ụkwa a gwọrọ agwọ:
Nwanne ọ bụrụ na ị ritubeghị ụkwa e nye gị nke a, ị ga-ericha ya ma taa efere gị.
Ụkwa e ji naanị mmanụ nri e tinyere ose na nnu sie na-atọwa ntị, ọkachasị e sichaa ya ka o dee ede.
Ị tụkwasịzịe ya azụ ọkpọọ maọbụ okporoko ị mara na ị garuola 'Galilee'.
2) Ụkwa e tinyere ọka:
Nwanne i ritula ụkwa e tinyere ọka e siri esi? Kedụ etu ụbụrụ gị si nabata ya?
Isi ọ gbara gị ka 'popcorn' mgbe ị kunyere ya n'ọnụ gị?
Ụdịrị ụtọ ụkwa a na-atọ abụghị ihe e kwesịrị ịkọrọ gị akọrọ; ọ bụ ihe ị kwesịrị iji aka gị nwalee ma gbaa ama.
3) Ụkwa e tinyere akwụkwọ nri
Ndị Enugwu-Ukwu unu anọkwa ya eh?
Nwanne i ritula ụkwa ndị obodo a siri? A ga-eji gị eji igbochi gị ilo ngaji i ji rie nri gị.
Ọ naghị amachakwa mma n'anya ma ha sichaa ya, mana i detu ya ọnụ, ị mara na ụwa bụ mmịmị.
Ha na-etinye ya akwụkwọ nri, azụ ọkpọ, okporoko, ogiri, nnu, nakwa ose.
Kedụ ndị ọzọ ị ma na-esi etu a esi nke ha?
4) Ụkwa a na-etinyeghi ihe ọbụla
Ụfọdụ obodo ịma atụ, Urualla, anaghị etinyekarị ihe ọbụla n'ime ụkwa ha.
Ị makwa na ha ejighikwa ịṅụ mmiri ụkwa egwu egwu?
Mgbe ha ga-esi ya etu a, ha anaghị etinye ya nnu, ose maọbụ ihe ọbụla chaa chaa.
Ịgwa gị eziokwu, ọ na-atọwakwa agba etu a. Detu ya ọnụ ka ị gwa anyị ihe ị gatara.
4) Ụkwa e ghere eghe:
Ọ bụrụ na ị tatubeghi ụkwa e ghere eghe, ị mazịkwa nke ekwe na-akụ?
Ụfọdụ na-ekwu na ọ na-atọ ka ọpụpa/ahụekere, mana ngwa gị onye tatụrụla ya gwa anyị, ọ bụ eziokwu?
Ụkwa e ghere eghe na-atọ ezigbo ụtọ ma i jiri akịoyibo maọbụ akị e tiri eti takọọ ya.
Kedụ etu e si esi ụkwa?
Ihe ndị e ji esi ụkwa gụnyere ose, nnu, mmanụ nri, ụfọdụ na-etinye ogiri, ụfọdụ na-etinye azụ dị iche iche, ụfọdụ na-etinye ọka, akanwụ, ngọ nakwa ihe ndị ọzọ nwereike ime ka o ghee ọsịsọ.
Ihe ndị a ka ị ga-eme tupu i sie ụkwa gị:
- Saa ụkwa gị mmiri ọfụma iji hụ na aja maọbụ kịrịkịrị okwute adịghị ya n'ime
- Wunye ya n'ime ite tụmadụ nke bekee kpọrọ 'pressure pot' ma wunyekwa ya mmiri ga-ekpuchi ya ọfụma
- Ụfọdụ na-etinye akanwụ maọbụ ngọ iji mee ka o dee ma ghee ọsịsọ
- O ghewe nakwa mmiri dị n'ime ya tawa, tinye ya ose akwọrọ akwọ, mmanụ nri na nnu
- Hapụ ya ka ya na ngwanri ndị ị tinyere n'ime ya sụkọta ọnụ
- Kpagharịa ya ma hapụzịa ya ka ọ nọrọ n'ọkụ dee ede ma ghee ọfụma.
E nwere ụzọ ọzọ i si esi ụkwa gị na-adịghị ebe a? Ngwa gwa anyị.
Ihe nkiri a ga-amasị gị: