You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Boko Haram: Ihe ndị mmadụ sara Buhari maka 'mmeri' Boko Haram
Onyeisiala Muhammadu Buhari kwuru n'ụbọchị Tọzde na mmeri ọchịchị ya meriri Boko Haram ebutela Nịajirịa nsọpụrụ n'ụwa niile.
Dịka ụlọ ntaakụkọ Premium Times siri kọwa, o kwuru nke a n'ozi oziri n'ọgbọ Eagles Square nke dị n'Abuja.
N'ọnụ onyeisiala "Ị ga-ekweta na mmeri anyị nwetara enyeghachila anyị nsọpụrụ na ugwu n'ụwa niile".
Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ jiri okwu ya maa njakịrị n'elu soshal midia.
Onye dịka Ephraim Jidauna sị ya kedụ ebe mmeri ahụ dị n'ihi na ụjọ ka jide ọtụtụ mmadụ ugbua karịa na mbụ.
King Davies kwuru na ndị na-adụ ya ndụmọdụ bụ ndị iro Naịjirịa n'ihi na onyeisiala Buhari amaghị ihe na-akpọtụ n'obodo.
Teesleek na-ajụ ma Onyeisiala ebikwa na Naịjirịa chaa chaa?
Roun kwenyere n'okwu ha na-ekwu na Buhari amaghị etu ihe si kwụrụ ya mere o ji aṅụrịrị maka mmeri ya
Nchọpụta nke Premium Times mere gosiri na ihe karịrị mmadụ narị abụọ nwụrụ n'ihi okwu nchekwa sọsọ na Jenụwarị afọ a.
Cheta na ndị ụlọomeiwu kpọkwara oku ka onyeisiala gbanwee ndị ọchịagha dị icheiche mana o gebeghi ntị n'okwu a.